The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 22

Numbers 22:25

Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị, o tinyere isi nʼahụ mgbidi ogige ubi ahụ, chọọ isite nʼebe ahụ gafee. Mgbe ọ na-eme nke a, o mere ka mgbidi ahụ chihịapụ Belam ụkwụ. Ya mere Belam tiri ịnyịnya ibu ahụ ihe ọzọ.

Numbers 22:25 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Numbers 22Next →

Numbers 22:25 in other translations

KJV King James Version

And when the ass saw the angel of the LORD, she thrust herself unto the wall, and crushed Balaam's foot against the wall: and he smote her again.

BSB Berean Standard Bible

And the donkey saw the angel of the LORD and pressed herself against the wall, crushing Balaam’s foot against it. So he beat her once again.

WEB World English Bible

The donkey saw the LORD’s angel, and she thrust herself to the wall, and crushed Balaam’s foot against the wall. He struck her again.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

22 Ma iwe were Chineke nʼihi na ọ na-aga, ma mmụọ ozi Onyenwe anyị guzochiri ụzọ igbochi ya. Belam na ndị odibo ya abụọ nọ na-elu ịnyịnya ibu ya.

23 Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o guzochiri nʼụzọ, jide mma a mịpụtara amịpụta nʼaka ya, ịnyịnya ibu ahụ chigharịrị onwe ya hapụ okporoụzọ, tinye isi nʼọhịa. Ma Belam tiri ya ihe ịchụghachi ya nʼụzọ.

24 Nʼoge a, mmụọ ozi Onyenwe anyị guzochiri nʼụzọ dị warawara, nke dị nʼetiti mgbidi ogige ubi vaịnị abụọ.

25 Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị, o tinyere isi nʼahụ mgbidi ogige ubi ahụ, chọọ isite nʼebe ahụ gafee. Mgbe ọ na-eme nke a, o mere ka mgbidi ahụ chihịapụ Belam ụkwụ. Ya mere Belam tiri ịnyịnya ibu ahụ ihe ọzọ.

26 Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị gakwara nʼihu nʼokporoụzọ ahụ nọchie ụzọ ahụ ebe dị nnọọ mkpakọta, ebe ịnyịnya ibu ahụ na-agaghị enwe ike gafee, maọbụ ichigharị aka nri maọbụ aka ekpe.

27 Nʼihi nke a, mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị o dinara ala nʼokporoụzọ. Nʼoke iwe, Belam ji mkpara dị ya nʼaka tie ya ihe ọzọ.

28 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mere ka ịnyịnya ibu ahụ kwuo okwu. Ọ jụrụ Belam ajụjụ sị, “Gịnị ka m mere gị i ji tie m ihe ugboro atọ?”

Read Numbers 22 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV