The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 22
Nʼihi nke a, mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị o dinara ala nʼokporoụzọ. Nʼoke iwe, Belam ji mkpara dị ya nʼaka tie ya ihe ọzọ.
Numbers 22:27 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 22Next →
And when the ass saw the angel of the LORD, she fell down under Balaam: and Balaam's anger was kindled, and he smote the ass with a staff.
When the donkey saw the angel of the LORD, she lay down under Balaam, and he became furious and beat her with his staff.
The donkey saw the LORD’s angel, and she lay down under Balaam. Balaam’s anger burned, and he struck the donkey with his staff.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
24 Nʼoge a, mmụọ ozi Onyenwe anyị guzochiri nʼụzọ dị warawara, nke dị nʼetiti mgbidi ogige ubi vaịnị abụọ.
25 Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị, o tinyere isi nʼahụ mgbidi ogige ubi ahụ, chọọ isite nʼebe ahụ gafee. Mgbe ọ na-eme nke a, o mere ka mgbidi ahụ chihịapụ Belam ụkwụ. Ya mere Belam tiri ịnyịnya ibu ahụ ihe ọzọ.
26 Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị gakwara nʼihu nʼokporoụzọ ahụ nọchie ụzọ ahụ ebe dị nnọọ mkpakọta, ebe ịnyịnya ibu ahụ na-agaghị enwe ike gafee, maọbụ ichigharị aka nri maọbụ aka ekpe.
27 Nʼihi nke a, mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị o dinara ala nʼokporoụzọ. Nʼoke iwe, Belam ji mkpara dị ya nʼaka tie ya ihe ọzọ.
28 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mere ka ịnyịnya ibu ahụ kwuo okwu. Ọ jụrụ Belam ajụjụ sị, “Gịnị ka m mere gị i ji tie m ihe ugboro atọ?”
29 Belam zara ịnyịnya ibu ahụ sị, “Ọ bụ nʼihi na i meela ka m dị ka onye nzuzu! Nʼezie, a sị na m ji mma agha nʼaka m, agaara m egbu gị.”
30 Ịnyịnya ibu ahụ gwara Balam okwu ọzọ sị ya, “Ọ bụ na mụ onwe m abụghị ịnyịnya ibu gị nke ị na-anọ nʼelu ya ogologo oge ndị a niile? Ọ dịla mgbe m si otu a meso gị omume nʼime ndụ m niile?” Belam zara sị ya, “Ee.”
Read Numbers 22 in the app The whole chapter