The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 22

Numbers 22:23

Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o guzochiri nʼụzọ, jide mma a mịpụtara amịpụta nʼaka ya, ịnyịnya ibu ahụ chigharịrị onwe ya hapụ okporoụzọ, tinye isi nʼọhịa. Ma Belam tiri ya ihe ịchụghachi ya nʼụzọ.

Numbers 22:23 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Numbers 22Next →

Numbers 22:23 in other translations

KJV King James Version

And the ass saw the angel of the LORD standing in the way, and his sword drawn in his hand: and the ass turned aside out of the way, and went into the field: and Balaam smote the ass, to turn her into the way.

BSB Berean Standard Bible

When the donkey saw the angel of the LORD standing in the road with a drawn sword in his hand, she turned off the path and went into a field. So Balaam beat her to return her to the path.

WEB World English Bible

The donkey saw the LORD’s angel standing in the way, with his sword drawn in his hand; and the donkey turned out of the path, and went into the field. Balaam struck the donkey, to turn her into the path.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

20 Nʼabalị ahụ, Chineke gwara Belam okwu sị ya, “Ebe ọ bụ na ndị a bịara ịkpọ gị oku, bilie soro ha gaa, kama jikere ikwu naanị okwu m ga-etinye gị nʼọnụ.”

21 Ya mere, mgbe chi echi ya bọrọ, Belam rigooro nʼelu ịnyịnya ibu ya soro ụmụ eze Moab gaa.

22 Ma iwe were Chineke nʼihi na ọ na-aga, ma mmụọ ozi Onyenwe anyị guzochiri ụzọ igbochi ya. Belam na ndị odibo ya abụọ nọ na-elu ịnyịnya ibu ya.

23 Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o guzochiri nʼụzọ, jide mma a mịpụtara amịpụta nʼaka ya, ịnyịnya ibu ahụ chigharịrị onwe ya hapụ okporoụzọ, tinye isi nʼọhịa. Ma Belam tiri ya ihe ịchụghachi ya nʼụzọ.

24 Nʼoge a, mmụọ ozi Onyenwe anyị guzochiri nʼụzọ dị warawara, nke dị nʼetiti mgbidi ogige ubi vaịnị abụọ.

25 Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị, o tinyere isi nʼahụ mgbidi ogige ubi ahụ, chọọ isite nʼebe ahụ gafee. Mgbe ọ na-eme nke a, o mere ka mgbidi ahụ chihịapụ Belam ụkwụ. Ya mere Belam tiri ịnyịnya ibu ahụ ihe ọzọ.

26 Mgbe ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị gakwara nʼihu nʼokporoụzọ ahụ nọchie ụzọ ahụ ebe dị nnọọ mkpakọta, ebe ịnyịnya ibu ahụ na-agaghị enwe ike gafee, maọbụ ichigharị aka nri maọbụ aka ekpe.

Read Numbers 22 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV