The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Mark 15
Pailet jụrụ ya ajụjụ ọzọ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ọsịsa ọbụla? Lee ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị.”
Mark 15:4 · Baịbụlụ Nsọ
And Pilate asked him again, saying, Answerest thou nothing? behold how many things they witness against thee.
Then Pilate questioned Him again, “Have You no answer? Look how many charges they are bringing against You!”
Pilate again asked him, “Have you no answer? See how many things they testify against you!”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Nʼezigbo isi ụtụtụ, ndịisi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu, na ndị nzukọ ndị okenye niile, nwere mkpebi. Ha kere Jisọs agbụ, duru ya nyefee nʼaka Pailet.
2 Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara sị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.”
3 Mgbe ahụ ndịisi nchụaja boro ya ebubo banyere ọtụtụ ihe.
4 Pailet jụrụ ya ajụjụ ọzọ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ọsịsa ọbụla? Lee ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị.”
5 Ma Jisọs azaghị ihe ọzọ. Nke a juru Pailet anya.
6 Ugbu a, ọ bụ omenaala nʼoge mmemme, na a ga-ahapụ otu onye mkpọrọ, bụ onye ha rịọrọ ka a hapụ.
7 Nʼoge ahụ kwa, otu nwoke a na-akpọ Barabas nọ nʼụlọ mkpọrọ, ya na ụfọdụ ndị biliri megide isi ọchịchị, ndị gbukwara mmadụ nʼoge ọgbaaghara ahụ.
Read Mark 15 in the app The whole chapter