The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Mark 15
Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara sị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.”
Mark 15:2 · Baịbụlụ Nsọ
And Pilate asked him, Art thou the King of the Jews? And he answering said unto him, Thou sayest it.
So Pilate questioned Him, “Are You the King of the Jews?” “You have said so,” Jesus replied.
Pilate asked him, “Are you the King of the Jews?” He answered, “So you say.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Nʼezigbo isi ụtụtụ, ndịisi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu, na ndị nzukọ ndị okenye niile, nwere mkpebi. Ha kere Jisọs agbụ, duru ya nyefee nʼaka Pailet.
2 Pailet jụrụ ya sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Ọ zara sị ya, “Gị onwe gị kwuru ya.”
3 Mgbe ahụ ndịisi nchụaja boro ya ebubo banyere ọtụtụ ihe.
4 Pailet jụrụ ya ajụjụ ọzọ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ọsịsa ọbụla? Lee ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị.”
5 Ma Jisọs azaghị ihe ọzọ. Nke a juru Pailet anya.
Read Mark 15 in the app The whole chapter