The Bible › Baịbụlụ Nsọ › John 5
Ha jụrụ ya, “Onye bụ onye ahụ gwara gị ka ị chilie ya laa?”
John 5:12 · Baịbụlụ Nsọ
Then asked they him, What man is that which said unto thee, Take up thy bed, and walk?
“Who is this man who told you to pick it up and walk?” they asked.
Then they asked him, “Who is the man who said to you, ‘Take up your mat and walk’?”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
9 Nʼotu oge ahụ, ahụ dịrị nwoke ahụ mma, ọ chịlịri ute ya, malite ijegharị. Ihe a mere nʼụbọchị izuike.
10 Ma ndị Juu gwara nwoke ahụ a gwọrọ ọrịa, “Taa bụ ụbọchị izuike, o megidere iwu na ị ga-ebu ute gị.”
11 Ma ọ zaghachiri ha, “Nwoke ahụ mere ka ahụ dị m mma sịrị m, ‘Chilie ute gị laa.’ ”
12 Ha jụrụ ya, “Onye bụ onye ahụ gwara gị ka ị chilie ya laa?”
13 Ma nwoke ahụ a gwọrọ amataghị onye ọ bụ nʼihi na Jisọs zoro onwe ya banye nʼetiti igwe mmadụ.
14 Emesịa, Jisọs hụrụ ya nʼime ụlọnsọ ukwu sị ya, “Lee, e mela ka ahụ dị gị mma, emehiekwala ọzọ ka nke dị njọ karịa nke a hapụ ịbịakwasị gị.”
15 Nwoke a siri nʼebe ahụ pụọ gaa gwa ndị Juu na ọ bụ Jisọs gwọrọ ya.
Read John 5 in the app The whole chapter