The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Job 35
Nʼezie, Chineke adịghị aṅa ntị nʼarịrịọ efu ha; Onye pụrụ ime ihe niile a dịghị elebara ya anya.
Job 35:13 · Baịbụlụ Nsọ
Surely God will not hear vanity, neither will the Almighty regard it.
Surely God does not listen to empty pleas, and the Almighty does not take note of it.
Surely God will not hear an empty cry, neither will the Almighty regard it.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 Ma ọ dịghị onye na-asị, ‘Olee ebe Chineke onye kere m nọ, onye na-enye abụ nʼime abalị,
11 onye na-akụziri anyị ihe karịa ka ọ na-akụziri ụmụ anụ ọhịa nke ụwa, onye na-eme ka anyị bụrụ ndị maara ihe karịa ụmụ nnụnụ nke igwe?’
12 Ọ dịghị azaghachi mgbe ụmụ mmadụ na-eti mkpu akwa, nʼihi ịnya isi nke ndị ajọ omume.
13 Nʼezie, Chineke adịghị aṅa ntị nʼarịrịọ efu ha; Onye pụrụ ime ihe niile a dịghị elebara ya anya.
14 Ma ya bụrụzie nke a ị na-ekwu, ọ ga-esi aṅaa gee ntị mgbe ị na-ekwu na ị dịghị ahụ ya anya, na i burula ikpe gị bịa nʼihu ya na ị ga-anọkwa na-eche ya!
15 Ọzọ, nʼihi na iwe ya adịghị eweta ntaramahụhụ, nʼihi na ọ dịghị arịba ama ajọ omume ọ bụladị nke dịkarịsịrị nta.
16 Ya mere, Job saghere ọnụ ya kwuo okwu dịka onye na-amaghị ihe; ka onye na-enweghị uche ọ na-ekwu okwu nkwukwasị efu.”
Read Job 35 in the app The whole chapter