The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 32
O wukwara ọtụtụ ụlọ ọzọ ebe a na-echebe ọka, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv. O wukwara ụlọ anụmanụ maka ọtụtụ igwe ewu na atụrụ ya.
2 Chronicles 32:28 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 32Next →
Storehouses also for the increase of corn, and wine, and oil; and stalls for all manner of beasts, and cotes for flocks.
He also made storehouses for the harvest of grain and new wine and oil, stalls for all kinds of livestock, and pens for the flocks.
also storehouses for the increase of grain, new wine, and oil; and stalls for all kinds of animals, and flocks in folds.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
25 Ma Hezekaya ejighị obi ya niile kelee Chineke ekele nʼihi na nganga batara ya nʼobi. Nke a mere ka iwe wee Onyenwe anyị megide ya na ndị Jerusalem na Juda.
26 Mgbe Hezekaya na ndị Jerusalem wedara onwe ha nʼala, iwe Onyenwe anyị dajụrụ nʼebe ha nọ, ọ takwaghị ha ahụhụ nʼoge niile ahụ Hezekaya dị ndụ.
27 Ya mere, Hezekaya ghọrọ eze bara ọgaranya, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ. O wuru ụlọakụ maka ichebe ọlaọcha ya na ọlaedo, na nkume dị oke ọnụahịa, na ụda na-esi isi ụtọ, na ọta na efere ọlaedo ya.
28 O wukwara ọtụtụ ụlọ ọzọ ebe a na-echebe ọka, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv. O wukwara ụlọ anụmanụ maka ọtụtụ igwe ewu na atụrụ ya.
29 O wukwara ọtụtụ obodo nta dị iche iche, nweekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, nʼihi na Chineke mere ka ọ baa ụba.
30 Hezekaya bụkwa onye gbochiri mmiri iyi Gaihọn nʼakụkụ elu elu ya, gwuo olulu ebe mmiri ahụ si sọgharịa na-asọbata nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo Devid. Ihe niile o mere gaara ya nke ọma.
31 Ma mgbe ndị ozi nke ndị na-achị Babilọn zitere ka ha jụọ ya banyere ihe ebube ahụ nke mere nʼala ahụ, Chineke hapụrụ ya i nwalee ya, ka ọ mara ihe niile dị ya nʼobi.
Read 2 Chronicles 32 in the app The whole chapter