The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 32

2 Chronicles 32:25

Ma Hezekaya ejighị obi ya niile kelee Chineke ekele nʼihi na nganga batara ya nʼobi. Nke a mere ka iwe wee Onyenwe anyị megide ya na ndị Jerusalem na Juda.

2 Chronicles 32:25 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead 2 Chronicles 32Next →

2 Chronicles 32:25 in other translations

KJV King James Version

But Hezekiah rendered not again according to the benefit done unto him; for his heart was lifted up: therefore there was wrath upon him, and upon Judah and Jerusalem.

BSB Berean Standard Bible

But because his heart was proud, Hezekiah did not repay the favor shown to him. Therefore wrath came upon him and upon Judah and Jerusalem.

WEB World English Bible

But Hezekiah didn’t reciprocate appropriate to the benefit done for him, because his heart was lifted up. Therefore there was wrath on him, Judah, and Jerusalem.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

22 Otu a ka Onyenwe anyị si zọpụta Hezekaya na ndị Jerusalem, site nʼaka Senakerib eze Asịrịa, na sitekwa nʼaka ndị iro ya ndị ọzọ. Udo dịkwara nʼala ya niile.

23 Site nʼoge ahụ, Hezekaya ghọrọ eze a maara aha ya na mba niile dị Juda gburugburu. Ọtụtụ mmadụ bidokwara ibutere Onyenwe anyị onyinye dị iche iche na Jerusalem. Hezekaya nʼonwe ya nwetakwara onyinye nke ya.

24 Ma nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa, ruo na ọ gaara anwụ. Ma o kpere ekpere rịọ Onyenwe anyị ka ọ gwọọ ya. Ọ zara ekpere ya, gosikwa ya ihe ịrịbama dị ebube.

25 Ma Hezekaya ejighị obi ya niile kelee Chineke ekele nʼihi na nganga batara ya nʼobi. Nke a mere ka iwe wee Onyenwe anyị megide ya na ndị Jerusalem na Juda.

26 Mgbe Hezekaya na ndị Jerusalem wedara onwe ha nʼala, iwe Onyenwe anyị dajụrụ nʼebe ha nọ, ọ takwaghị ha ahụhụ nʼoge niile ahụ Hezekaya dị ndụ.

27 Ya mere, Hezekaya ghọrọ eze bara ọgaranya, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ. O wuru ụlọakụ maka ichebe ọlaọcha ya na ọlaedo, na nkume dị oke ọnụahịa, na ụda na-esi isi ụtọ, na ọta na efere ọlaedo ya.

28 O wukwara ọtụtụ ụlọ ọzọ ebe a na-echebe ọka, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv. O wukwara ụlọ anụmanụ maka ọtụtụ igwe ewu na atụrụ ya.

Read 2 Chronicles 32 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV