The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 32
Hezekaya bụkwa onye gbochiri mmiri iyi Gaihọn nʼakụkụ elu elu ya, gwuo olulu ebe mmiri ahụ si sọgharịa na-asọbata nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo Devid. Ihe niile o mere gaara ya nke ọma.
2 Chronicles 32:30 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 32Next →
This same Hezekiah also stopped the upper watercourse of Gihon, and brought it straight down to the west side of the city of David. And Hezekiah prospered in all his works.
It was Hezekiah who blocked the upper outlet of the Spring of Gihon and channeled it down to the west side of the City of David. And Hezekiah prospered in all that he did.
This same Hezekiah also stopped the upper spring of the waters of Gihon, and brought them straight down on the west side of David’s city. Hezekiah prospered in all his works.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
27 Ya mere, Hezekaya ghọrọ eze bara ọgaranya, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ. O wuru ụlọakụ maka ichebe ọlaọcha ya na ọlaedo, na nkume dị oke ọnụahịa, na ụda na-esi isi ụtọ, na ọta na efere ọlaedo ya.
28 O wukwara ọtụtụ ụlọ ọzọ ebe a na-echebe ọka, na mmanya vaịnị ọhụrụ, na mmanụ oliv. O wukwara ụlọ anụmanụ maka ọtụtụ igwe ewu na atụrụ ya.
29 O wukwara ọtụtụ obodo nta dị iche iche, nweekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, nʼihi na Chineke mere ka ọ baa ụba.
30 Hezekaya bụkwa onye gbochiri mmiri iyi Gaihọn nʼakụkụ elu elu ya, gwuo olulu ebe mmiri ahụ si sọgharịa na-asọbata nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke obodo Devid. Ihe niile o mere gaara ya nke ọma.
31 Ma mgbe ndị ozi nke ndị na-achị Babilọn zitere ka ha jụọ ya banyere ihe ebube ahụ nke mere nʼala ahụ, Chineke hapụrụ ya i nwalee ya, ka ọ mara ihe niile dị ya nʼobi.
32 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Hezekaya, na ọrụ ebere niile nke ọ rụrụ ka edere nʼakwụkwọ ọhụ onye amụma bụ Aịzaya, nwa Emọz, dịkwa nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda na Izrel niile.
33 Hezekaya sooro ndị nna nna ya dinaa nʼọnwụ, e lie ya nʼugwu nʼebe ili ndị nna nna Devid dị. Ndị Juda niile na ndị niile bi na Jerusalem kwanyere ya ugwu nʼọnwụ ya. Manase nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
Read 2 Chronicles 32 in the app The whole chapter