The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Proverbs 19
Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi, ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide.
Proverbs 19:4 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Proverbs 19Next →
Wealth maketh many friends; but the poor is separated from his neighbour.
Wealth attracts many friends, but a poor man is deserted by his friend.
Wealth adds many friends, but the poor is separated from his friend.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Ọ ka mma ịbụ ogbenye onye kwesiri ntụkwasị obi karịa ịbụ onye nzuzu na-ekwu okwu ụgha mgbe niile.
2 Arịrịọ nke na-enweghị ihe ọmụma adịghị mma otu a kwa onye ụkwụ ya na-eme ngwa na-ejehie ụzọ.
3 Enweghị uche nke mmadụ na-eduba ha nʼọghọm, ma obi ha na-ewe iwe dị ukwuu megide Onyenwe anyị.
4 Onye nwere ego na-enwe ọtụtụ ndị enyi, ma ọ na-ara ahụ ka ndị enyi onye ogbenye nọgide.
5 Onye na-agba ama ụgha ga-ata ahụhụ, ụzọ onye na-ekupụ ụgha dịka ume ka a ga-achọpụtakwa.
6 Ọtụtụ mmadụ na-achọ ihuọma nʼebe onye na-achị achị nọ, otu a kwa, mmadụ niile na-agbalị ịbụ enyi onye na-agbasa aka ya na-enye onyinye.
7 Ebe ọ bụ na ụmụnne onye ogbenye na-akpọ ya asị, gịnịkwa ka ndị enyi ya ga-eme? Mgbalị ya niile ịrịọ ha arịrịọ ezughị ime ka ha nọgide.
Read Proverbs 19 in the app The whole chapter