The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 28
Tinyere oke ehi ọbụla, ị ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwara mmanụ chụọ aja. Ma lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtakwara mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka maka otu ebule ọbụla.
Numbers 28:12 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 28Next →
And three tenth deals of flour for a meat offering, mingled with oil, for one bullock; and two tenth deals of flour for a meat offering, mingled with oil, for one ram;
along with three-tenths of an ephah of fine flour mixed with oil as a grain offering with each bull, two-tenths of an ephah of fine flour mixed with oil as a grain offering with the ram,
and three tenths of an ephah of fine flour for a meal offering mixed with oil, for each bull; and two tenth parts of fine flour for a meal offering mixed with oil, for the one ram;
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
9 “ ‘Nʼụbọchị izuike, jiri ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, ha na aja ihe ọṅụṅụ na aja mkpụrụ ọka e ji lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri akwọzi, nke a gwaziri mmanụ mee.
10 Nke a bụ aja nsure ọkụ nke Ụbọchị Izuike, tinyere aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ ndị ahụ a na-achụ nʼoge ha.
11 “ ‘Ọzọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa ọbụla, a ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ dị iche, nke a ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ.
12 Tinyere oke ehi ọbụla, ị ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwara mmanụ chụọ aja. Ma lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtakwara mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka maka otu ebule ọbụla.
13 Ma nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla, ọ bụ lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtara ya na mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka. A ga-eji ha chụọ aja nsure ọkụ nke isisi ya ga-atọkwa Onyenwe anyị ezi ụtọ.
14 Aja ọbụla a chụrụ ga-enwe aja ihe ọṅụṅụ nke ga-eso ya, lita mmanya abụọ maka otu oke ehi, ihe ji ntakịrị karịa otu lita mmanya nʼisi otu ebule, na otu lita nʼisi otu nwa atụrụ. Nke a ga-abụ aja nsure ọkụ nke a ga-achụ nʼoge ọnwa ọhụrụ ọ bụla, nʼime afọ ọbụla,
15 nʼagbanyeghị aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ nke a na-achụ dịka mgbe ha si dị, a ga-eche otu mkpi nʼihu Onyenwe anyị dịka aja mmehie.
Read Numbers 28 in the app The whole chapter