The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 28
“ ‘Ọzọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa ọbụla, a ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ dị iche, nke a ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ.
Numbers 28:11 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 28Next →
And in the beginnings of your months ye shall offer a burnt offering unto the LORD; two young bullocks, and one ram, seven lambs of the first year without spot;
At the beginning of every month, you are to present to the LORD a burnt offering of two young bulls, one ram, and seven male lambs a year old, all unblemished,
“‘In the beginnings of your months, you shall offer a burnt offering to the LORD: two young bulls, one ram, seven male lambs a year old without defect,
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
8 Nʼoge anyasị, ị ga-ewerekwa nwa atụrụ nke abụọ, ya na otu ụdị aja mkpụrụ ọka na aja ihe ọṅụṅụ dị ka i mere nʼụtụtụ, jiri chụọ aja. Nke a bụkwa aja e sitere nʼọkụ chụọ, nke isisi ya dị ezi mma nye Onyenwe anyị.
9 “ ‘Nʼụbọchị izuike, jiri ụmụ atụrụ abụọ gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ, ha na aja ihe ọṅụṅụ na aja mkpụrụ ọka e ji lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri akwọzi, nke a gwaziri mmanụ mee.
10 Nke a bụ aja nsure ọkụ nke Ụbọchị Izuike, tinyere aja nsure ọkụ na aja ihe ọṅụṅụ ndị ahụ a na-achụ nʼoge ha.
11 “ ‘Ọzọ, nʼụbọchị mbụ nke ọnwa ọbụla, a ga-achụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ dị iche, nke a ga-eji ụmụ oke ehi abụọ, na otu ebule, na ụmụ ebule asaa gbara otu afọ, otu afọ, ndị na-enweghị ntụpọ chụọ.
12 Tinyere oke ehi ọbụla, ị ga-eji lita ụtụ ọka isii na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwara mmanụ chụọ aja. Ma lita ụtụ ọka anọ na ọkara a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtakwara mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka maka otu ebule ọbụla.
13 Ma nʼisi otu nwa atụrụ ọbụla, ọ bụ lita ụtụ ọka abụọ a kwọziri nke ọma, nke a gwakọtara ya na mmanụ ka a ga-eji chụọ aja mkpụrụ ọka. A ga-eji ha chụọ aja nsure ọkụ nke isisi ya ga-atọkwa Onyenwe anyị ezi ụtọ.
14 Aja ọbụla a chụrụ ga-enwe aja ihe ọṅụṅụ nke ga-eso ya, lita mmanya abụọ maka otu oke ehi, ihe ji ntakịrị karịa otu lita mmanya nʼisi otu ebule, na otu lita nʼisi otu nwa atụrụ. Nke a ga-abụ aja nsure ọkụ nke a ga-achụ nʼoge ọnwa ọhụrụ ọ bụla, nʼime afọ ọbụla,
Read Numbers 28 in the app The whole chapter