The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 18
Unu na ezinaụlọ unu nwere ike iri ndị fọdụrụ nʼụlọ unu, maọbụ nʼebe ọbụla masịrị unu, nʼihi na ha bụ ụgwọ ọrụ unu nʼihi ozi niile unu jere nʼụlọ nzute.
Numbers 18:31 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Numbers 18Next →
And ye shall eat it in every place, ye and your households: for it is your reward for your service in the tabernacle of the congregation.
And you and your households may eat the rest of it anywhere; it is the compensation for your work at the Tent of Meeting.
You may eat it anywhere, you and your households, for it is your reward in return for your service in the Tent of Meeting.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
28 Nʼụzọ dị otu a, unu onwe unu ga-eche onyinye unu nʼihu Onyenwe anyị site nʼonyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri unu si nʼaka ụmụ Izrel nata. Site nʼonyinye ndị a unu natara, unu ga-enye Erọn onye nchụaja onyinye ahụ ruuru Onyenwe anyị.
29 Onyinye unu ga-enye dịka nke ruuru Onyenwe anyị ga-abụ akụkụ onyinye ndị ahụ kachasị mma, na ndị kachasị ịdị nsọ.’
30 “Gwa ndị Livayị okwu sị ha, ‘Mgbe unu wetara akụkụ onyinye ndị ahụ kachasị mma, a ga-agụnyere unu ya dịka a ga-asị na ọ bụ onyinye unu si nʼebe ịzọcha ọka, na nʼebe ịzọcha mmanya vaịnị unu weta.
31 Unu na ezinaụlọ unu nwere ike iri ndị fọdụrụ nʼụlọ unu, maọbụ nʼebe ọbụla masịrị unu, nʼihi na ha bụ ụgwọ ọrụ unu nʼihi ozi niile unu jere nʼụlọ nzute.
32 Ikpe ọmụma agaghị adịrị unu mgbe unu na-eri ya ma ọ bụrụ na unu chere onyinye ndị ahụ kachasị mma nʼihu Onyenwe anyị. Ma kpachapụnụ anya hụ na unu e merụghị onyinye ndị a dị nsọ ụmụ Izrel webatara. Ọ bụrụ na unu emee nke a, unu ga-anwụ.’ ”
Read Numbers 18 in the app The whole chapter