The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Numbers 18

Numbers 18:29

Onyinye unu ga-enye dịka nke ruuru Onyenwe anyị ga-abụ akụkụ onyinye ndị ahụ kachasị mma, na ndị kachasị ịdị nsọ.’

Numbers 18:29 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Numbers 18Next →

Numbers 18:29 in other translations

KJV King James Version

Out of all your gifts ye shall offer every heave offering of the LORD, of all the best thereof, even the hallowed part thereof out of it.

BSB Berean Standard Bible

You must present the offering due the LORD from all the best of every gift, the holiest part of it.’

WEB World English Bible

Out of all your gifts, you shall offer every wave offering to the LORD, of all its best parts, even the holy part of it.’

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

26 “Gwa ndị Livayị okwu sị, ‘Mgbe unu si nʼaka ụmụ Izrel nata onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ m nyere unu dịka ihe nketa, unu aghaghị isite nʼonyinye ahụ nye otu ụzọ nʼime ụzọ iri dịka onyinye nye Onyenwe anyị.

27 A ga-agụ onyinye unu wetara dịka ọ bụ onyinye ọka unu si nʼebe ịzọcha ọka weta, maọbụ dịka mmanya unu si nʼebe ịzọcha mmanya weta.

28 Nʼụzọ dị otu a, unu onwe unu ga-eche onyinye unu nʼihu Onyenwe anyị site nʼonyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri unu si nʼaka ụmụ Izrel nata. Site nʼonyinye ndị a unu natara, unu ga-enye Erọn onye nchụaja onyinye ahụ ruuru Onyenwe anyị.

29 Onyinye unu ga-enye dịka nke ruuru Onyenwe anyị ga-abụ akụkụ onyinye ndị ahụ kachasị mma, na ndị kachasị ịdị nsọ.’

30 “Gwa ndị Livayị okwu sị ha, ‘Mgbe unu wetara akụkụ onyinye ndị ahụ kachasị mma, a ga-agụnyere unu ya dịka a ga-asị na ọ bụ onyinye unu si nʼebe ịzọcha ọka, na nʼebe ịzọcha mmanya vaịnị unu weta.

31 Unu na ezinaụlọ unu nwere ike iri ndị fọdụrụ nʼụlọ unu, maọbụ nʼebe ọbụla masịrị unu, nʼihi na ha bụ ụgwọ ọrụ unu nʼihi ozi niile unu jere nʼụlọ nzute.

32 Ikpe ọmụma agaghị adịrị unu mgbe unu na-eri ya ma ọ bụrụ na unu chere onyinye ndị ahụ kachasị mma nʼihu Onyenwe anyị. Ma kpachapụnụ anya hụ na unu e merụghị onyinye ndị a dị nsọ ụmụ Izrel webatara. Ọ bụrụ na unu emee nke a, unu ga-anwụ.’ ”

Read Numbers 18 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV