The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Matthew 8
Ọ sịrị, “Onyenwe m, onye na-ejere m ozi dina nʼụlọ nʼoke ihe mgbu, akụkụ ahụ ya kpọnwụkwara akpọnwụ.”
Matthew 8:6 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Matthew 8Next →
And saying, Lord, my servant lieth at home sick of the palsy, grievously tormented.
“Lord, my servant lies at home, paralyzed and in terrible agony.”
saying, “Lord, my servant lies in the house paralyzed, grievously tormented.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
3 O setịpụrụ aka ya, metụ ya sị, “Achọrọ m ka ị dị ọcha, dịrịkwa ọcha!” Ngwangwa, ekpenta ahụ lara.
4 Jisọs nyere nwoke ahụ iwu sị ya, “Hụ na ịgwaghị onye ọbụla, kama gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chụọkwa aja onyinye dịka Mosis, nyere nʼiwu, ka ọ bụrụ ihe ama nye ya.”
5 Mgbe ọ banyere na Kapanọm, otu onye ọchịagha bịakwutere ya rịọọ ka o nyere ya aka.
6 Ọ sịrị, “Onyenwe m, onye na-ejere m ozi dina nʼụlọ nʼoke ihe mgbu, akụkụ ahụ ya kpọnwụkwara akpọnwụ.”
7 Jisọs sịrị ya, “Ọ bụ m bịa gwọọ ya?”
8 Ma onye ọchịagha ahụ zara ya sị, “Onyenwe m, ekwesighị m ka ị bata nʼokpuru ụlọ m. Naanị nọdụ nʼebe a, kwuo okwu, ahụ ga-adịkwa onye na-ejere m ozi ike.
9 Nʼihi na mụ onwe m bụkwa onye nọ nʼokpuru ikike ọchịchị, nwee ndị agha nọ nʼokpuru m. Ana m asị onye nke a, ‘gaa.’ Ọ gaa, sịkwa onye nke ọzọ, ‘bịa.’ Ọ bịa. Ana m asị ohu m, ‘mee nke a.’ Ọ na-emekwa ya.”
Read Matthew 8 in the app The whole chapter