The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Matthew 21
E mere nke a ka okwu e kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo.
Matthew 21:4 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Matthew 21Next →
All this was done, that it might be fulfilled which was spoken by the prophet, saying,
This took place to fulfill what was spoken through the prophet:
All this was done that it might be fulfilled which was spoken through the prophet, saying,
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Mgbe ha na-abịaru Jerusalem nso, ha rutere Betfeji dị nʼUgwu Oliv. Jisọs zipụrụ mmadụ abụọ nʼime ndị na-eso ụzọ ya.
2 Ọ gwara ha sị, “Baanụ nʼime obodo nta ahụ dị unu nʼihu, ngwangwa unu ga-ahụ otu ịnyịnya ibu elibere nʼosisi nʼebe ahụ, nke ya na nwa ya nọ nʼotu ebe. Tọpụta ha ma kpụtaranụ m ha.
3 Ọ bụrụkwa na onye ọbụla asị unu ihe ọbụla, unu ga-asị ha, ọ dị Onyenwe anyị mkpa, ọ ga-akpụghachitekwa ha ngwangwa.”
4 E mere nke a ka okwu e kwuru site nʼọnụ onye amụma mezuo.
5 “Gwanụ ada Zayọn sị, ‘lee, eze gị ka ọ na-abịakwute gị. Ọ bụ onye dị nwayọọ. Ọ na-anọkwasịkwa nʼelu ịnyịnya ibu, ee, nʼelu nwa ịnyịnya, nwa ịnyịnya na-ebu ibu.’ ”
6 Ndị na-eso ụzọ ya gara mee ihe Jisọs sịrị ha mee.
7 Ha kpụtara ịnyịnya ibu ahụ na nwa ịnyịnya ahụ, wụkwasịkwa uwe ha nʼelu ha ka Jisọs nọkwasị nʼelu ha.
Read Matthew 21 in the app The whole chapter