The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Mark 7

Mark 7:8

Unu atụfuola iwu Chineke ma jidesiekwa aka ike nʼomenaala nke mmadụ.”

Mark 7:8 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Mark 7Next →

Mark 7:8 in other translations

KJV King James Version

For laying aside the commandment of God, ye hold the tradition of men, as the washing of pots and cups: and many other such like things ye do.

BSB Berean Standard Bible

You have disregarded the commandment of God to keep the tradition of men.”

WEB World English Bible

“For you set aside the commandment of God, and hold tightly to the tradition of men—the washing of pitchers and cups, and you do many other such things.”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

5 Ya mere ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebi nʼusoro omenaala ndị okenye. Karịa iji aka na-adịghị ọcha rie nri ha?”

6 Ọ sịrị ha, “Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu; dị ka e dere ya sị, “ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.

7 Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu, ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’

8 Unu atụfuola iwu Chineke ma jidesiekwa aka ike nʼomenaala nke mmadụ.”

9 Ma ọ gwakwara ha sị, “Unu nwere ụzọ dị mma nʼanya unu nke unu ji wezuga iwu Chineke ma were omenaala unu dochie nʼọnọdụ ya.

10 Nʼihi na Mosis sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị,’na, ‘onye ọbụla kwujọrọ nne maọbụ nna ya ka e gbuo ya.’

11 Ma unu na-asị, na ọ bụrụ na mmadụ asị nne ya maọbụ nna ya, ‘Ihe ọbụla bụ nke ị gara erite nʼaka m bụ kọban,’ (nke pụtara onyinye dịrị Chineke).

Read Mark 7 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV