The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Mark 7
Ọ sịrị ha, “Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu; dị ka e dere ya sị, “ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.
Mark 7:6 · Baịbụlụ Nsọ
He answered and said unto them, Well hath Esaias prophesied of you hypocrites, as it is written, This people honoureth me with their lips, but their heart is far from me.
Jesus answered them, “Isaiah prophesied correctly about you hypocrites, as it is written: ‘These people honor Me with their lips, but their hearts are far from Me.
He answered them, “Well did Isaiah prophesy of you hypocrites, as it is written, ‘This people honors me with their lips, but their heart is far from me.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
3 Ndị Farisii na ndị Juu niile adịghị eri nri ma ọ bụrụ na ha akwọghị aka, nʼihi na ha na-ejigidesi aka ike nʼozizi na omenaala nke ndị okenye.
4 Mgbe ọbụla ha si nʼahịa lọta, ha adịghị eri nri ma ọ bụghị ma ha sachara onwe ha. Ha na-edebekwa ọtụtụ omenaala ndị ọzọ dị ka ịsacha iko, na ite mmiri na ketụlụ.
5 Ya mere ndị Farisii na ndị ozizi iwu jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebi nʼusoro omenaala ndị okenye. Karịa iji aka na-adịghị ọcha rie nri ha?”
6 Ọ sịrị ha, “Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu; dị ka e dere ya sị, “ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.
7 Ofufe ha na-efe m bụ ihe efu, ozizi ha bụkwa ihe mmadụ nyere nʼiwu.’
8 Unu atụfuola iwu Chineke ma jidesiekwa aka ike nʼomenaala nke mmadụ.”
9 Ma ọ gwakwara ha sị, “Unu nwere ụzọ dị mma nʼanya unu nke unu ji wezuga iwu Chineke ma were omenaala unu dochie nʼọnọdụ ya.
Read Mark 7 in the app The whole chapter