The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Mark 14
Mgbe ahụ ụfọdụ biliri gbaa ama ụgha megide ya, sị,
Mark 14:57 · Baịbụlụ Nsọ
And there arose certain, and bare false witness against him, saying,
Then some men stood up and testified falsely against Him:
Some stood up and gave false testimony against him, saying,
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
54 Pita sooro ha, ma ọ nọ nʼebe dị anya. O sooro ha bata nʼobi onyeisi nchụaja. Nʼebe ahụ, o sooro ndị nche nọdụ ọdụ na-anya ọkụ.
55 Ndịisi nchụaja na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ukwu nọ na-achọ ama megide Jisọs, ka ha nwee ike gbuo ya. Ma ọ dịghị nke ha chọtara.
56 Ọtụtụ bịara gbaa ama ụgha megide ya, ma ama ha abụghị otu.
57 Mgbe ahụ ụfọdụ biliri gbaa ama ụgha megide ya, sị,
58 “Anyị nụrụ mgbe o kwuru sị, ‘Aga m akwatu ụlọnsọ ukwu a nke e ji aka wuo, nʼụbọchị atọ aga m ewukwa ụlọ ọzọ, nke a na-ejighị aka wuo.’ ”
59 Ọ bụladị na nke a, ama ha niile adakọtakwaghị nʼotu.
60 Mgbe ahụ, onyeisi nchụaja biliri ọtọ nʼihu ha, jụọ Jisọs ajụjụ sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị ka i nwere ikwu banyere ama ndị a a na-agba megide gị?”
Read Mark 14 in the app The whole chapter