The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Leviticus 5

Leviticus 5:13

Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja ikpuchi mmehie ya niile. A ga-agbagharakwa ya. Ụtụ ọka fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja, dịka e si mee ya nʼaja onyinye mkpụrụ ọka.’ ”

Leviticus 5:13 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Leviticus 5Next →

Leviticus 5:13 in other translations

KJV King James Version

And the priest shall make an atonement for him as touching his sin that he hath sinned in one of these, and it shall be forgiven him: and the remnant shall be the priest's, as a meat offering.

BSB Berean Standard Bible

In this way the priest will make atonement for him for any of these sins he has committed, and he will be forgiven. The remainder will belong to the priest, like the grain offering.”

WEB World English Bible

The priest shall make atonement for him concerning his sin that he has sinned in any of these things, and he will be forgiven; and the rest shall be the priest’s, as the meal offering.’”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

10 Onye nchụaja ga-eji nnụnụ nke ọzọ chụọ aja nsure ọkụ. Ọ ga-agbaso usoro e debere maka ịchụ aja nsure ọkụ. Ọ ga-ekpuchikwara ha mmehie ha mere. A ga-agbagharakwa ha.

11 “ ‘Ọ bụrụ na onye ahụ enweghị ike iweta nduru abụọ, maọbụ kpalakwukwu abụọ, ọ ga-eweta iko ọka asaa a kwọrọ nke ọma ka ọ bụrụ onyinye aja mmehie. Ọ gaghị etinye ya mmanụ oliv na ụda na-esi isi ụtọ, nʼihi na ọ bụ aja mmehie.

12 Ha ga-ewere ya bịakwute onye nchụaja, onye ga-ekporo nke ga-eju ya aka ya dịka oke ncheta. Kpọọ ya ọkụ nʼebe ịchụ aja nke onyinye nsure ọkụ e chere nʼihu Onyenwe anyị. Nke a ga-abụkwa aja mmehie ya.

13 Nʼụzọ dị otu a, onye nchụaja ga-achụrụ ya aja ikpuchi mmehie ya niile. A ga-agbagharakwa ya. Ụtụ ọka fọdụrụ ga-abụ nke onye nchụaja, dịka e si mee ya nʼaja onyinye mkpụrụ ọka.’ ”

14 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,

15 “Mgbe onye ọbụla sitere na-amaghị ama mehie, merụọ ihe nsọ niile nke Onyenwe anyị, bụrụ onye nke nʼekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị. Ọ ga-ewetara Onyenwe anyị otu ebule na-enweghị ntụpọ site nʼigwe anụ, dịka ọnụahịa ya si dị nʼọlaọcha, nʼusoro shekel nke ebe nsọ. Ọ bụ aja ikpe ọmụma.

16 Ọ ga-akwụghachikwa ụgwọ ihe nsọ ndị ahụ niile nke ọ na-emezughị. Ọ ga-atụkwasị otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke ọnụahịa ya nʼelu ya, were ha niile nye onye nchụaja. Onye nchụaja ahụ ga-ewere ebule ahụ na ihe ndị a chụọrọ ya aja mkpuchi mmehie, nʼihi ikpe ọmụma ya. A ga-agbagharakwa ya.

Read Leviticus 5 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV