The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Leviticus 24
Ihe ọkụ ọlaedo a nụchara anụcha ndị ahụ dọọ nʼelu ihe ịdọkwasị oriọna, nʼihu Onyenwe anyị ga na-enwu ọkụ mgbe niile.
Leviticus 24:4 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Leviticus 24Next →
He shall order the lamps upon the pure candlestick before the LORD continually.
He shall tend the lamps on the pure gold lampstand before the LORD continually.
He shall keep in order the lamps on the pure gold lamp stand before the LORD continually.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị,
2 “Nye ndị Izrel niile iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv asụrụ asụ, nke a na-agwaghị ihe, maka itinye nʼiheọkụ ime ka ọkụ oriọna na-enwu mgbe niile.
3 Na mpụta nke akwa mgbochi nke kpuchiri igbe Ihe Ama ahụ, nʼime ụlọ nzute, Erọn ga-amụnye oriọna ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị mgbe niile, site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide nye ọgbọ niile dị nʼihu.
4 Ihe ọkụ ọlaedo a nụchara anụcha ndị ahụ dọọ nʼelu ihe ịdọkwasị oriọna, nʼihu Onyenwe anyị ga na-enwu ọkụ mgbe niile.
5 “Were ọka a kwọrọ nke ọma mee ogbe achịcha iri na abụọ. Jiri ihe ruru iko ọka asatọ mee otu ogbe achịcha ọbụla.
6 Doo achịcha ndị a nʼahịrị abụọ nʼelu tebul ahụ e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, nke dị nʼihu Onyenwe anyị. Ogbe achịcha isii ga-adị nʼotu ahịrị.
7 Nʼogologo ahịrị ọbụla tinye insensi a na-agwaghị ihe, ka ọ bụrụ ihe nọchiri achịcha ndị a dịka onyinye nsure ọkụ nye Onyenwe anyị.
Read Leviticus 24 in the app The whole chapter