The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Jonah 2
“Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara, na-agbakụta ebere Chineke azụ.
Jonah 2:8 · Baịbụlụ Nsọ
They that observe lying vanities forsake their own mercy.
Those who cling to worthless idols forsake His loving devotion.
Those who regard vain idols forsake their own mercy.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
5 Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m, ogbu mmiri na-erikpu m. Achara mmiri kekụkwara m nʼisi.
6 Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri, ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi. Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ, Onyenwe anyị, bụ Chineke m.
7 “Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike, e chetara m gị Onyenwe anyị, ma ekpere m bịakwutere gị, nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ.
8 “Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara, na-agbakụta ebere Chineke azụ.
9 Ma ọ bụ olu abụ ekele ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja. Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere. Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’ ”
10 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ.
Read Jonah 2 in the app The whole chapter