The Bible › Baịbụlụ Nsọ › John 12

John 12:5

“Gịnị mere na-ereghị mmanụ otite a narị denarị atọ, were ego ya nye ndị ogbenye?”

John 12:5 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead John 12Next →

John 12:5 in other translations

KJV King James Version

Why was not this ointment sold for three hundred pence, and given to the poor?

BSB Berean Standard Bible

“Why wasn’t this perfume sold for three hundred denarii and the money given to the poor?”

WEB World English Bible

“Why wasn’t this ointment sold for three hundred denarii and given to the poor?”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

2 Nʼebe ahụ, ha siiri Jisọs nri, ọ bụkwa Mata na-eje ozi isi nri ahụ, Lazarọs bụ otu onye nʼime ndị sooro ya nọdụ na nri ahụ.

3 Mgbe ahụ, Meri weere mmanụ otite dị ọkara lita nke ezigbo naad, mmanụ isi ụtọ dị oke ọnụahịa, ọ wụkwasara ya Jisọs nʼụkwụ, jirikwa agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya. Nke a mere ka ụlọ ahụ jupụta nʼisi ụtọ nke mmanụ otite ahụ.

4 Ma Judas Iskarịọt, otu nʼime ndị na-eso ụzọ ya, onye ahụ ga-arara ya nye, kwuru,

5 “Gịnị mere na-ereghị mmanụ otite a narị denarị atọ, were ego ya nye ndị ogbenye?”

6 O kwughị nke a nʼihi na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya nʼobi kama nʼihi na ọ bụ onye ohi; dị ka onye na-ejide akpa ego ha, mgbe ụfọdụ, ọ na-amanye aka nʼego ahụ zubiri ego.

7 Jisọs sịrị, “Hapụ ya aka, ọ zụtara ya ka ọ na-akwado maka ụbọchị olili m.

8 Unu nwere ndị ogbenye nʼetiti unu mgbe niile, ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.”

Read John 12 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV