The Bible › Baịbụlụ Nsọ › John 12
Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọbụla kwere na m, ọ bụghị na m ka o kwere, kama ọ bụ na onye nke zitere m.
John 12:44 · Baịbụlụ Nsọ
Jesus cried and said, He that believeth on me, believeth not on me, but on him that sent me.
Then Jesus cried out, “Whoever believes in Me does not believe in Me alone, but in the One who sent Me.
Jesus cried out and said, “Whoever believes in me, believes not in me, but in him who sent me.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
41 Aịzaya kwuru ihe ndị a nʼihi na ọ hụrụ ebube ya, ma kwuo banyere ya.
42 Otu ọ dị, ọtụtụ nʼime ndịisi kweere na ya, ma ha ekwupụtaghị nke a. Nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị Farisii ga-achụpụ ha site nʼụlọ ekpere.
43 Nʼihi na ha hụrụ otuto mmadụ nʼanya karịa otuto Chineke.
44 Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọbụla kwere na m, ọ bụghị na m ka o kwere, kama ọ bụ na onye nke zitere m.
45 Nʼihi na onye ọbụla hụrụ m ahụla onye nke zitere m.
46 Abịara m nʼime ụwa dị ka ìhè ka onye ọbụla nke kwere na m ghara ịnọ nʼọchịchịrị.
47 “Ma ọ bụrụ na onye ọbụla anụ okwu m ma ju ime ya, ọ bụghị m na-ekpe ya ikpe. Nʼihi na abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe.
Read John 12 in the app The whole chapter