The Bible › Baịbụlụ Nsọ › John 12
Nʼihi na ha hụrụ otuto mmadụ nʼanya karịa otuto Chineke.
John 12:43 · Baịbụlụ Nsọ
For they loved the praise of men more than the praise of God.
For they loved praise from men more than praise from God.
for they loved men’s praise more than God’s praise.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
40 “O meela ka ha kpuo ìsì, mekwa ka obi ha kpọchie Ka ha ghara iji anya ha hụ ụzọ maọbụ jiri obi ha ghọta ihe ọbụla Ka ha gharakwa ichigharị, ka m gwọọ ha.”
41 Aịzaya kwuru ihe ndị a nʼihi na ọ hụrụ ebube ya, ma kwuo banyere ya.
42 Otu ọ dị, ọtụtụ nʼime ndịisi kweere na ya, ma ha ekwupụtaghị nke a. Nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị Farisii ga-achụpụ ha site nʼụlọ ekpere.
43 Nʼihi na ha hụrụ otuto mmadụ nʼanya karịa otuto Chineke.
44 Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọbụla kwere na m, ọ bụghị na m ka o kwere, kama ọ bụ na onye nke zitere m.
45 Nʼihi na onye ọbụla hụrụ m ahụla onye nke zitere m.
46 Abịara m nʼime ụwa dị ka ìhè ka onye ọbụla nke kwere na m ghara ịnọ nʼọchịchịrị.
Read John 12 in the app The whole chapter