The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 40
Onye nwere ike ịghọta Mmụọ nke Onyenwe anyị, maọbụ dịka onye ndụmọdụ Onyenwe anyị na-ezi ya ihe?
Isaiah 40:13 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Isaiah 40Next →
Who hath directed the Spirit of the LORD, or being his counsellor hath taught him?
Who has directed the Spirit of the LORD, or informed Him as His counselor?
Who has directed the LORD’s Spirit, or has taught him as his counselor?
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-abịa nʼike, ike aka ya ka o ji achị. Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, ọ na-abịa ịkwụghachi ụgwọ.
11 Ọ ga-azụ igwe atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ. Ọ na-achịkọta ụmụ atụrụ. Nʼaka ya abụọ ka ọ ga-ekuru ụmụ atụrụ nʼobi ya. Ọ ga-eji nwayọọ duo ndị na-enye ụmụ ara.
12 Onye jirila ọbụ aka ya tụọ mmiri dị nʼoke osimiri? Maọbụ onye jiri ntu-aka ya tụọ mbara eluigwe? Onye ka ọ bụ jirila nkata kute uzuzu? Maọbụ jiri ihe ọtụtụ tụọ ugwu ukwu? Onye kwa ji ihe ọtụtụ tụọ ugwu nta?
13 Onye nwere ike ịghọta Mmụọ nke Onyenwe anyị, maọbụ dịka onye ndụmọdụ Onyenwe anyị na-ezi ya ihe?
14 Ọ bụ onye ka Onyenwe anyị gakwuru gbaa izu ka ọ kọwaara ya ihe, ọ bụ onye ziri ya ụzọ bụ nke dị mma? Onye bụ onye ahụ kuziri ya ihe ọmụma, maọbụ gosi ya ụzọ nke nghọta?
15 Nʼezie, mba niile dị iche iche dịka otu ntupụta mmiri tanyere nʼime efere; a na-agụnye ha dịka uzuzu dị nʼelu ihe ọtụtụ e ji atụ ihe; ọ na-atụ ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu dịka a ga-asị na ha bụ uzuzu ọma na-adịghị arọ.
16 Osisi niile dị na Lebanọn ezughị iji kwanye ọkụ e ji a chụrụ Chineke anyị aja. Otu a kwa, anụmanụ niile dị nʼọhịa Lebanọn niile erughị iji chụọrọ Chineke anyị aja.
Read Isaiah 40 in the app The whole chapter