The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 35

Isaiah 35:3

Meenụ ka aka ndị ahụ kụdara akụda dịkwa ike, gbaakwanụ ụkwụ ndị ahụ na-asọ ngọngọ ume.

Isaiah 35:3 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Isaiah 35Next →

Isaiah 35:3 in other translations

KJV King James Version

Strengthen ye the weak hands, and confirm the feeble knees.

BSB Berean Standard Bible

Strengthen the limp hands and steady the feeble knees!

WEB World English Bible

Strengthen the weak hands, and make the feeble knees firm.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 Nʼụbọchị ahụ, ọzara na ala kpọrọ nkụ ga-enwe obi ụtọ; okoko osisi mara mma ga-awapụtakwa nʼọzara. Dịka rozu,

2 ọ ga-agbawa ifuru jupụta; ọ ga-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu, tiekwa mkpu ọṅụ. A ga-enye ya nsọpụrụ nke ugwu Lebanọn, nyekwa ya ịma mma nke ala ubi Sharọn na Kamel. Ha ga-ahụ ebube Onyenwe anyị nʼebe ahụ, ha ga-ahụkwa ịdị ukwuu nke Chineke anyị.

3 Meenụ ka aka ndị ahụ kụdara akụda dịkwa ike, gbaakwanụ ụkwụ ndị ahụ na-asọ ngọngọ ume.

4 Gwanụ ndị ahụ na-atụ egwu sị ha, “Dịrịnụ ike, unu atụla egwu, nʼihi na Chineke unu na-abịa. Ọ ga-abịa ịbọtara unu ọbọ, ịkwụghachi ndị iro unu ihe ruuru ha. Ọ ga-abịa ịzọpụta unu.”

5 Mgbe ọ bịara, ọ ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì, meekwa ka ndị ntị chiri nụ ihe.

6 Ọ ga-eme ka onye ngwụrọ wulie elu dịka ele, meekwa ka ndị na-adịghị ekwu okwu tie mkpu ọṅụ. Mmiri ga-agbawapụta sọọ nʼọzara, mmiri iyi ga-ejupụtakwa nʼala kpọrọ nkụ.

Read Isaiah 35 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV