The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 32

Isaiah 32:3

Mgbe ahụ, agaghị emechikwa anya ndị niile na-ahụ ụzọ, agakwaghị eme ka ntị na-anụ ihe kwụsị ịnụ ihe.

Isaiah 32:3 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Isaiah 32Next →

Isaiah 32:3 in other translations

KJV King James Version

And the eyes of them that see shall not be dim, and the ears of them that hear shall hearken.

BSB Berean Standard Bible

Then the eyes of those who see will no longer be closed, and the ears of those who hear will listen.

WEB World English Bible

The eyes of those who see will not be dim, and the ears of those who hear will listen.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 Lee, eze ga-achị nʼezi omume na-abịa, ya na ndịisi kwesiri ntụkwasị obi, ndị ga-ekpe ikpe ziri ezi.

2 Onye ọbụla nʼime ha ga-aghọrọ ndị mmadụ ebe a na-ezere ndụ nʼoge oke ifufe, na ebe mgbaba nʼoge oke mmiri ozuzo. Ha ga-adị ka mmiri na-asọ nʼọzara, maọbụ dịka ndo nke nkume dị elu na-enye nʼebe okpomọkụ na-eweta ike ọgwụgwụ dị.

3 Mgbe ahụ, agaghị emechikwa anya ndị niile na-ahụ ụzọ, agakwaghị eme ka ntị na-anụ ihe kwụsị ịnụ ihe.

4 Ọ bụladị obi ndị nzuzu nʼetiti ha ga-ejupụta nʼakọnuche na nghọta, ndị ahụ na-asụ nsụ ga-ekwukwa okwu nke ọma.

5 Nʼụbọchị ahụ, a gaghị ahụkwa onye nzuzu sị na ọ bụ onye maara ihe. A gaghị enyekwa onye aghụghọ nsọpụrụ ọzọ.

6 Nʼihi na ndị nzuzu na-ekwu okwu na-echeghị echiche, obi ha niile dị na-ime ajọ ihe. Ọ na-ebi ndụ asọpụrụghị Chineke, na-ekwusakwa okwu njehie megide Onyenwe anyị; ndị agụụ na-agụ ka ha na-agbaba aka ndị akpịrị na-akpọ nkụ, ha adịghị enye ha mmiri ọṅụṅụ.

Read Isaiah 32 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV