The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 30

Isaiah 30:13

mmehie a ga-aghọrọ unu ihe dịka mgbidi dị elu, nke gbawara agbawa, nke ga-ada na mberede, nʼotu ntabi anya.

Isaiah 30:13 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Isaiah 30Next →

Isaiah 30:13 in other translations

KJV King James Version

Therefore this iniquity shall be to you as a breach ready to fall, swelling out in a high wall, whose breaking cometh suddenly at an instant.

BSB Berean Standard Bible

this iniquity of yours is like a breach about to fail, a bulge in a high wall, whose collapse will come suddenly— in an instant!

WEB World English Bible

therefore this iniquity shall be to you like a breach ready to fall, swelling out in a high wall, whose breaking comes suddenly in an instant.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

10 Ha na-agwa ndị ọhụ ụzọ, “Unu ahụkwala ọhụ, o zuola,” ma sịkwa ndị amụma, “Mechienụ ọnụ! Unu ahụtakwarala anyị ihe ziri ezi nʼọhụ unu. Gwanụ anyị ihe na-atọ ụtọ na ntị, buonu amụma nduhie.

11 Unu na-anọchiri anyị ụzọ, nyenụ anyị ohere. Anyị achọkwaghị ịnụ ihe ọbụla banyere onye ahụ unu na-akpọ Onye dị nsọ nke Izrel.”

12 Ya mere, ihe a ka Onye dị nsọ nke Izrel na-ekwu, “Nʼihi na unu kpọrọ okwu m na-agwa unu asị, ma dabere na mmegbu na-atụkwasịkwa obi unu nʼaghụghọ,

13 mmehie a ga-aghọrọ unu ihe dịka mgbidi dị elu, nke gbawara agbawa, nke ga-ada na mberede, nʼotu ntabi anya.

14 Ọ ga-etipịasị dịka ite aja, nke etipịara na-enweghị obi ebere, nke a na-enweghị ike ịchọta mpekele ejuju ọbụla nʼetiti ya, iji gụta ọkụ site na-ekwu, maọbụ kupụta mmiri site nʼite.”

15 Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nsọ nke Izrel sịrị, “Ọ bụ na nchegharị na izuike ka a ga-azọpụta unu, na ịnọ juu na ntụkwasị obi ka ịdị ike unu ga-adị, ma unu ekweghị na nke ọbụla.

16 Kama unu na-asị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼelu ịnyịnya gbapụ.’ E, unu ga-agba ọsọ nʼezie. Unu sịrị, ‘Anyị ga-arịkwasị nʼịnyịnya ndị na-efe ọsọ.’ Ya mere, ndị ga-achụ unu ga-adị ngwa.

Read Isaiah 30 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV