The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 3

Isaiah 3:13

Onyenwe anyị anyị ewerela ọnọdụ ya nʼụlọikpe; ọ na-eguzo ikpe ndị ya niile ikpe.

Isaiah 3:13 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Isaiah 3Next →

Isaiah 3:13 in other translations

KJV King James Version

The LORD standeth up to plead, and standeth to judge the people.

BSB Berean Standard Bible

The LORD arises to contend; He stands to judge the people.

WEB World English Bible

The LORD stands up to contend, and stands to judge the peoples.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

10 Zie ndị ezi omume niile ozi sị ha, na ihe ga-agara ha nke ọma, nʼihi na mkpụrụ sitere nʼomume ha niile ka ha ga-eri.

11 Ma gwa ndị na-emebi iwu na ahụhụ dịrị ha. Mbibi adakwasịla ha! Ha ga-eketa oke ruoru ha, nʼihi ihe aka ha kpataara ha.

12 Ụmụ okorobịa na-emegbu ndị m, ụmụ nwanyị na-achịkwa ha. Ndị m, lee na ndị na-achị unu na-eduhie unu ụzọ. Ha na-eme ka unu kpafuo; ha esitela nʼezi ụzọ wezuga unu.

13 Onyenwe anyị anyị ewerela ọnọdụ ya nʼụlọikpe; ọ na-eguzo ikpe ndị ya niile ikpe.

14 Onyenwe anyị na-aba nʼikpe megide ndị okenye na ndị ndu nke ndị ya niile. Ọ bụ unu bụ ndị lara ubi vaịnị m nʼiyi; ihe unu ji aka ike pụnara ndị ogbenye jupụtara nʼụlọ unu.

15 Gịnị mere unu ji azọpịa ndị m, “Gịnị mere unu ji si otu a na-egwepịa ihu ndị ogbenye?” Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara.

16 Ọzọkwa, Onyenwe anyị kwuru sị, “Ndị inyom Zayọn bụ ndị mpako. Ha ji olu e setịrị eseti, na anya na-achọgharị ndị ikom ha ga-aghọgbuta na-ejegharị. Ha na-ejegharịkwa na-arọ mma na-aṅagharịkwa ukwu, na-emekwa ka ihe ịchọ mma ọla ụkwụ ha na-ada ụda.

Read Isaiah 3 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV