The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 27
Nʼụbọchị ahụ, abụ a ga-adị nʼọnụ ha, abụ ha ga-abụ banyere ubi vaịnị nke na-amị ezi mkpụrụ.
Isaiah 27:2 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Isaiah 27Next →
In that day sing ye unto her, A vineyard of red wine.
In that day: “Sing about a fruitful vineyard.
In that day, sing to her, “A pleasant vineyard!
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eji mma agha ya iwe ya, dị ukwuu dịkwa ezigbo ike, taa agwọ ahụ na-akpụ akpụ bụ Leviatan ahụhụ. Leviatan bụ agwọ mgbakọ ahụ; ọ ga-egbukwa nnukwu anụ ọjọọ ahụ nke bi na mmiri.
2 Nʼụbọchị ahụ, abụ a ga-adị nʼọnụ ha, abụ ha ga-abụ banyere ubi vaịnị nke na-amị ezi mkpụrụ.
3 “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-elekọta ya, ana m agba ya mmiri ụbọchị niile, na-eche ya nche ehihie na abalị. Ka onye ọbụla ghara iji ihe ọjọọ leta ya.
4 Adịghị m ewekwa iwe. Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ogwu na uke na-echere m aka mgba, aga m ebili buso ha agha, aga m esurekwa ha ọkụ.
5 Ma ọ bụghị otu a, ka ha bịakwute m maka nchekwa, ha bịa ka mụ na ha mee udo. E, ha bịa ka mụ na ha mee udo.”
Read Isaiah 27 in the app The whole chapter