The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 2
Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume, na nʼọnụ e gwuru nʼala, nʼihi egwu Onyenwe anyị, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa.
Isaiah 2:19 · Baịbụlụ Nsọ
And they shall go into the holes of the rocks, and into the caves of the earth, for fear of the LORD, and for the glory of his majesty, when he ariseth to shake terribly the earth.
Men will flee to caves in the rocks and holes in the ground, away from the terror of the LORD and from the splendor of His majesty, when He rises to shake the earth.
Men shall go into the caves of the rocks, and into the holes of the earth, from before the terror of the LORD, and from the glory of his majesty, when he arises to shake the earth mightily.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
16 nye ụgbọ mmiri niile e ji azụ ahịa, na ụgbọ mmiri ndị ọzọ niile buru ibu maa mma.
17 Onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ niile ka a ga-eweda nʼala. Naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
18 A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa.
19 Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume, na nʼọnụ e gwuru nʼala, nʼihi egwu Onyenwe anyị, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa.
20 Nʼụbọchị ndị ahụ, ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ, nke ha kpụrụ ma na-efe, hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ.
21 Mgbe ahụ, ha ga-ezo onwe ha nʼoghere niile dị nʼoke nkume, na nʼime ọgba niile nke oke nkume nʼihi ịgbanarị iwe ọkụ Onyenwe anyị, na ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe o biliri ịyọgharị ụwa.
22 Kwụsị ịtụkwasị mmadụ efu obi. O nweghị ihe ọ bụ karịa naanị nkuume ahụ dị ya nʼime, nʼihi gịnị ka e ji agụnye ya?
Read Isaiah 2 in the app The whole chapter