The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Isaiah 2
Onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ niile ka a ga-eweda nʼala. Naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
Isaiah 2:17 · Baịbụlụ Nsọ
And the loftiness of man shall be bowed down, and the haughtiness of men shall be made low: and the LORD alone shall be exalted in that day.
So the pride of man will be brought low, and the loftiness of men will be humbled; the LORD alone will be exalted in that day,
The loftiness of man shall be bowed down, and the arrogance of men shall be brought low; and the LORD alone shall be exalted in that day.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
14 nye ugwu ukwu niile nke dị elu, na ugwu nta niile e buliri elu,
15 nye ụlọ elu niile, na mgbidi niile e wusiri ike,
16 nye ụgbọ mmiri niile e ji azụ ahịa, na ụgbọ mmiri ndị ọzọ niile buru ibu maa mma.
17 Onye nganga ka a ga-eweda nʼala, mpako nke ndị mmadụ niile ka a ga-eweda nʼala. Naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
18 A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa.
19 Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume, na nʼọnụ e gwuru nʼala, nʼihi egwu Onyenwe anyị, na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya, mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa.
20 Nʼụbọchị ndị ahụ, ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ, nke ha kpụrụ ma na-efe, hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ.
Read Isaiah 2 in the app The whole chapter