The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 47

Genesis 47:8

Fero jụrụ Jekọb sị, “Ị gbaala afọ ole ugbu a?”

Genesis 47:8 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Genesis 47Next →

Genesis 47:8 in other translations

KJV King James Version

And Pharaoh said unto Jacob, How old art thou?

BSB Berean Standard Bible

“How many years have you lived?” Pharaoh asked.

WEB World English Bible

Pharaoh said to Jacob, “How old are you?”

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

5 Fero gwara Josef sị, “Nna gị na ụmụnne gị abịakwutela gị. Ha biri nʼala Goshen.

6 Ala Ijipt dịkwa gị nʼihu. Họrọ ebe ọbụla masịrị gị nke dịkwa ezi mma nye nna gị na ụmụnne gị ka ha biri. Ka ha biri na Goshen. Ọ bụrụkwa na ị maara ndị ikom nʼetiti ha ndị nwere ike, mee ha ndị na-elekọta igwe anụ ụlọ m.”

7 Josef kpọtara nna ya Jekọb, mee ka o guzo nʼihu Fero. Jekọb nọ nʼebe ahụ gọzie Fero.

8 Fero jụrụ Jekọb sị, “Ị gbaala afọ ole ugbu a?”

9 Jekọb zara Fero sị ya: “Ebiela m dịka onye ọbịa narị afọ na iri afọ atọ. Ọnụọgụgụ afọ ndị a ehighị nne, ma ha jupụtara nʼahụhụ na nsogbu. Ma a nọrubeghị m ọnụọgụgụ afọ nna m ha gbara mgbe ha biri nʼụwa dịka ọbịa.”

10 Jekọb gọziri Fero, site nʼihu ya pụọ.

11 Ya mere, Josef mere ka nna ya na ụmụnne ya biri nʼala Ijipt. O nyere ha ala kachasị mma nʼala ahụ na mpaghara Ramesis, dịka Fero nyere nʼiwu.

Read Genesis 47 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV