The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 41
Ma nʼoge ahụ, onyeisi ndị na-ebu iko jekwuuru Fero gwa ya sị, “Taa ka m chetara mmehie m.
Genesis 41:9 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Genesis 41Next →
Then spake the chief butler unto Pharaoh, saying, I do remember my faults this day:
Then the chief cupbearer said to Pharaoh, “Today I recall my failures.
Then the chief cup bearer spoke to Pharaoh, saying, “I remember my faults today.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
6 Emesịa, ọ hụkwara ogbe ọka asaa ọzọ ka ha mịkwara nʼotu ukwu ọka ahụ. Ma ndị a ọ hụrụ kpọnwụsịrị akpọnwụ, fịkpọkwa afịkpọ. Ọ bụ ikuku si nʼọwụwa anyanwụ mere ka ha kpọnwụọ.
7 Ogbe ọka ndị a fịkpọrọ afịkpọ loro ogbe ọka asaa ndị ahụ buru ibu. Fero kwolitere hụ na ihe ndị a bụ nrọ.
8 Mgbe chi bọrọ, o nweghị udo na mmụọ ya. O ziri ozi kpọkọta ndị majiki niile, na ndị ọkachamara niile nke Ijipt. Fero kọọrọ ha ihe ọ rọrọ na nrọ. Ma ọ dịghị onye nwere ike ịkọwara ya ihe nrọ ya pụtara.
9 Ma nʼoge ahụ, onyeisi ndị na-ebu iko jekwuuru Fero gwa ya sị, “Taa ka m chetara mmehie m.
10 Oge ahụ Fero were iwe megide ndị na-ejere ya ozi, o tinyere mụ na onyeisi ndị na-esi nri nʼụlọ mkpọrọ nke dị nʼebe onyeisi ndị nche eze bi.
11 Onye ọbụla nʼime anyị abụọ rọrọ nrọ nʼotu abalị, nrọ ọbụla nwekwara nkọwa nke ya.
12 O nwere nwokorobịa onye Hibru anyị na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ nʼoge ahụ. Ọ bụ ohu onyeisi ndị nche eze. Anyị kọọrọ ya nrọ anyị rọrọ. Ọ kọwakwaara anyị ihe nrọ anyị pụtara nye onye ọbụla nkọwa nke nrọ ya.
Read Genesis 41 in the app The whole chapter