The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Genesis 36

Genesis 36:4

Ada mụụrụ Ịsọ Elifaz, ebe Basemat mụrụ Reuel.

Genesis 36:4 · Baịbụlụ Nsọ

← PreviousRead Genesis 36Next →

Genesis 36:4 in other translations

KJV King James Version

And Adah bare to Esau Eliphaz; and Bashemath bare Reuel;

BSB Berean Standard Bible

And Adah bore Eliphaz to Esau, Basemath gave birth to Reuel,

WEB World English Bible

Adah bore to Esau Eliphaz. Basemath bore Reuel.

Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.

In context

1 Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Ịsọ, onye a na-akpọ Edọm.

2 Ịsọ lụrụ ndị inyom a site nʼala Kenan. Onye nke mbụ bụ Ada nwa Elọn, onye Het. Nke abụọ bụ Oholibama, nwa Ana, nwa nwa Zibiọn, onye Hiv.

3 Onye nke atọ bụ Basemat, nwa Ishmel, onye nwanne ya nwanyị bụ Nebaiot.

4 Ada mụụrụ Ịsọ Elifaz, ebe Basemat mụrụ Reuel.

5 Oholibama mụtaara Jeush na Jalam na Kora. Ndị a bụ ụmụ Ịsọ ndị a mụtara ya nʼala Kenan.

6 Emesịa, Ịsọ duuru ndị nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom, na ndị niile nọ nʼezinaụlọ ya. Ọ chịkọọrọ anụ ụlọ ya niile, na akụ niile ọ kpatara nʼala Kenan kwapụ gaa biri nʼala dị anya site nʼebe nwanne ya Jekọb nọ.

7 Ebe ọ bụ na akụnụba ha nwere dịkarịrị ukwuu ha ibikọta ọnụ, tinyekwara na ala ebe ha bi enwezighị ike ibuli ha nʼihi anụ ụlọ niile ha nwere.

Read Genesis 36 in the app The whole chapter

Search the Scriptures

Choose a translation

KJVBSBWEBNHEBASVYLTDBYWBTBBEEBRGNVDRALUTCANRIVLSGRVABPMYORIGBSWATGLIRV