The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Ezekiel 21
“ ‘Ọnwụnwa aghaghị ịbịa. Ma gịnị ga-eme, ma ọ bụrụ na mkpara eze nke mma agha na-elelị anya, agaghị nʼihu na-adịgide? Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’
Ezekiel 21:13 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Ezekiel 21Next →
Because it is a trial, and what if the sword contemn even the rod? it shall be no more, saith the Lord GOD.
Surely testing will come! And what if even the scepter, which the sword despises, does not continue?’ declares the Lord GOD.
“For there is a trial. What if even the rod that condemns will be no more?” says the Lord GOD.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 Amụọla ya nʼihi oke ogbugbu nke gaje ịdị, hichakwaa ya nke ọma ka ọ na-egbu dịka amụma. “ ‘Anyị ọ ga-aṅụrị ọṅụ na mkpara eze nwa m nwoke Juda? Mma agha na-elelị mkpara niile dị otu a anya.
11 “ ‘E nyere iwu ka e hichazie mma agha ahụ, ka e jidekwa ya nʼaka. A mụọla ya, hichazie ya. E doziela ya maka onye ahụ ga-eji ya laa ndụ nʼiyi.
12 Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa ma kwasie akwa ike, nʼihi na ọ bụ megide ndị m ọ bụkwa megide ndịisi Izrel niile. A na-atụnyere ha mma agha ga-egbu ha, ha na ndị m. Nʼihi ya, tie aka gị nʼobi gị.
13 “ ‘Ọnwụnwa aghaghị ịbịa. Ma gịnị ga-eme, ma ọ bụrụ na mkpara eze nke mma agha na-elelị anya, agaghị nʼihu na-adịgide? Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’
14 “Nʼihi ya, buo amụma, nwa nke mmadụ. Kụkọọ ọbụ aka gị abụọ, ka mma agha gbuo ugboro abụọ e, ọ bụladị ugboro atọ. Ọ bụ mma agha e debere maka ogbugbu, nke e debere maka oke ogbugbu nke ga-abịachibido ha gburugburu.
15 Ka obi ha gbazee site nʼegwu, ka ndị na-ada ada hie nne, nʼihi na edoziela m mma agha ahụ nʼọnụ ụzọ ama ha niile maka oke ogbugbu. Lee, mma agha ahụ na-egbu amụma, etinyela ya nʼaka onye ga-egbu oke ogbugbu.
16 Gị mma agha, ebe ọbụla ị chọrọ, ebe ọbụla i nwere ike, gbuo onye ọbụla, ma ọ nọ gị nʼaka nri ma ọ nọ gị nʼaka ekpe.
Read Ezekiel 21 in the app The whole chapter