The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Exodus 6
Emere m ka ọgbụgba ndụ m guzosie ike nʼetiti mụ na ha, ọgbụgba ndụ nke inye ha ala Kenan ebe ha biri dịka ndị ọbịa.
Exodus 6:4 · Baịbụlụ Nsọ
And I have also established my covenant with them, to give them the land of Canaan, the land of their pilgrimage, wherein they were strangers.
I also established My covenant with them to give them the land of Canaan, the land where they lived as foreigners.
I have also established my covenant with them, to give them the land of Canaan, the land of their travels, in which they lived as aliens.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m ga-eme Fero. Nʼihi ike aka m, ọ ga-ezipụ ha. Nʼihi ike aka, ọ ga-achụpụ ha site nʼala ya.”
2 Chineke gara nʼihu gwa Mosis sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
3 Egosiri m Ebraham na Aịzik na Jekọb onwe m dịka Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Ma ọ dịghị mgbe m mere ka ha mata aha m dịka Onyenwe anyị.
4 Emere m ka ọgbụgba ndụ m guzosie ike nʼetiti mụ na ha, ọgbụgba ndụ nke inye ha ala Kenan ebe ha biri dịka ndị ọbịa.
5 Ugbu a, anụla m ịsụ ude ụmụ Izrel, bụ ndị ahụ ndị Ijipt mere ka ha bụrụ ndị ohu. Echetakwala m ọgbụgba ndụ m.
6 “Ya mere, gwa ụmụ Izrel, ‘Abụ m Onyenwe anyị. Aga m akpọpụta unu site nʼọnọdụ ịbụ ohu ndị Ijipt. Aga m eme ka unu nwere onwe unu site nʼọnọdụ ịbụ ndị ohu nye ha. Aga m eji aka ike m nke m ga-esetipụ, ya na ihe ngosipụta dị ukwuu nke ikpe ikpe m, gbapụta unu.
7 Mgbe ahụ, aga m ewere unu ka unu bụrụ ndị m. Aga m abụ Chineke unu. Unu ga-amata na m bụ Onyenwe anyị, onye kpọpụtara unu site nʼaka ịbụ ohu nʼala Ijipt.
Read Exodus 6 in the app The whole chapter