The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Exodus 6
Chineke gara nʼihu gwa Mosis sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
Exodus 6:2 · Baịbụlụ Nsọ
And God spake unto Moses, and said unto him, I am the LORD:
God also told Moses, “I am the LORD.
God spoke to Moses, and said to him, “I am the LORD.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m ga-eme Fero. Nʼihi ike aka m, ọ ga-ezipụ ha. Nʼihi ike aka, ọ ga-achụpụ ha site nʼala ya.”
2 Chineke gara nʼihu gwa Mosis sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
3 Egosiri m Ebraham na Aịzik na Jekọb onwe m dịka Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Ma ọ dịghị mgbe m mere ka ha mata aha m dịka Onyenwe anyị.
4 Emere m ka ọgbụgba ndụ m guzosie ike nʼetiti mụ na ha, ọgbụgba ndụ nke inye ha ala Kenan ebe ha biri dịka ndị ọbịa.
5 Ugbu a, anụla m ịsụ ude ụmụ Izrel, bụ ndị ahụ ndị Ijipt mere ka ha bụrụ ndị ohu. Echetakwala m ọgbụgba ndụ m.
Read Exodus 6 in the app The whole chapter