The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Deuteronomy 21
ndị okenye gị, na ndị ikpe ga-apụta, tụọ ịdị anya nke obodo niile dị gburugburu ọhịa ahụ, site nʼebe ahụ onye ahụ e gburu egbu tọgbọ.
Deuteronomy 21:2 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead Deuteronomy 21Next →
Then thy elders and thy judges shall come forth, and they shall measure unto the cities which are round about him that is slain:
your elders and judges must come out and measure the distance from the victim to the neighboring cities.
then your elders and your judges shall come out, and they shall measure to the cities which are around him who is slain.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Mgbe ị batara nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị inweta, biri nʼime ya, ọ bụrụ na ị hụ otu onye e gburu egbu ka ọ tọgbọ nʼime ọhịa, ma ị maghị onye gburu ya,
2 ndị okenye gị, na ndị ikpe ga-apụta, tụọ ịdị anya nke obodo niile dị gburugburu ọhịa ahụ, site nʼebe ahụ onye ahụ e gburu egbu tọgbọ.
3 Ndị okenye obodo ahụ ga-ewere nwa nne ehi a na-ejibeghị rụọ ọrụ, maọbụ nyara yoku ọbụla
4 ha ga-eduru ya gaa na ndagwurugwu nke mmiri na-eru nʼime ya, ndagwurugwu a na-egwuzebeghị mgbe ọbụla ịrụ ọrụ ubi nʼime ya, nke a na-akụghị mkpụrụ nʼime ya, gbajie olu nwaagbọghọ ehi ahụ nʼebe ahụ.
5 Ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ga-abịa, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ahọpụtala ha ka ha bụrụ ndị na-ejere ya ozi. Ha ka ọ họpụtakwara ikwupụta ngọzị nʼaha Onyenwe anyị, na ikpe niile metụtara mmerụ ahụ.
Read Deuteronomy 21 in the app The whole chapter