The Bible › Baịbụlụ Nsọ › Acts 7
Onye chọtara ihuọma nʼebe Chineke nọ, ma rịọ ka o wuore Chineke nke Jekọb ebe obibi.
Acts 7:46 · Baịbụlụ Nsọ
Who found favour before God, and desired to find a tabernacle for the God of Jacob.
who found favor in the sight of God and asked to provide a dwelling place for the God of Jacob.
who found favor in the sight of God, and asked to find a habitation for the God of Jacob.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
43 Unu buliri ụlọ ikwu nke Mọlọk na kpakpando nke chi unu bụ Refan, bụ arụsị ndị ahụ unu mere ịkpọ isiala nye ha. Ya mere, aga m ewezuga unu, burukwa unu gaa nʼofe obodo Babilọn.’
44 “Ndị nna nna anyị ha nwere ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ nʼọzara. E mere ya site na ntụziaka na usoro ihe atụ Chineke gosiri Mosis.
45 Mgbe Joshua duuru nna nna anyị ha nweta ala ndị mba ọzọ ndị Chineke chụpụrụ. E butekwara igbe ọgbụgba ndụ a nʼala ahụ. Ọ nọgidekwara nʼala ahụ tutu ruo nʼoge Devid.
46 Onye chọtara ihuọma nʼebe Chineke nọ, ma rịọ ka o wuore Chineke nke Jekọb ebe obibi.
47 Ma ọ bụ Solomọn wuru ya ụlọ ahụ.
48 “Otu ọ dị, Onye kachasị ihe niile elu adịghị ebi nʼụlọ e ji aka wuo, dịka onye amụma kwuru,
49 “ ‘Eluigwe bụ ocheeze m. Ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m. Ụdị ụlọ dị aṅaa ka unu ga-ewuru m? Maọbụ ebee ka ebe izuike m ga-adị? Ka Onyenwe anyị kwuru.
Read Acts 7 in the app The whole chapter