The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 33
Nʼoge ahụ ka anya doro Manase. O wedara onwe ya ala nke ukwuu, rịọọ amara site nʼaka Onyenwe anyị Chineke nna nna ya.
2 Chronicles 33:12 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 33Next →
And when he was in affliction, he besought the LORD his God, and humbled himself greatly before the God of his fathers,
And in his distress, Manasseh sought the favor of the LORD his God and earnestly humbled himself before the God of his fathers.
When he was in distress, he begged the LORD his God, and humbled himself greatly before the God of his fathers.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
9 Ma Manase duhiere Juda na ndị Jerusalem, mee ka ha mee ihe dị njọ karịa nke ndị mba niile ndị Onyenwe anyị lara nʼiyi site nʼihu ndị Izrel.
10 Onyenwe anyị gwara Manase na ndị ya okwu, ma ha egeghị ntị.
11 Nʼihi ya, Onyenwe anyị mere ka ndị ọchịagha nke eze ndị Asịrịa bịa buso ha agha, bụ ndị jidere Manase, gbanye ya nko igwe nʼimi, were ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya laa Babilọn.
12 Nʼoge ahụ ka anya doro Manase. O wedara onwe ya ala nke ukwuu, rịọọ amara site nʼaka Onyenwe anyị Chineke nna nna ya.
13 Onyenwe anyị nụrụ arịrịọ ya mee ya ka ọ lọtakwa nʼalaeze ya na Jerusalem. Mgbe ahụ, Manase matara na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie.
14 Ọ bụ nʼoge a ka o wughachiri mgbidi nke abụọ gburugburu obodo Devid, na mgbidi dị nʼọdịda anyanwụ iyi Gaihọn na ndagwurugwu Kidrọn. Site nʼebe ahụ, o wuru ya ruo nʼọnụ ụzọ ama Azụ, na gburugburu ugwu Ofel ebe o wuliri ya elu. O dokwara ndịisi agha ya nʼobodo niile e wusiri ike dị na Juda.
15 O wezugara chi ndị mba ọzọ niile, wepụkwa oyiyi ahụ o tinyere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, kụtuokwa ụlọ arụsị o wuru nʼugwu ụlọnsọ, na ndị nke o wuru na Jerusalem. O sitere nʼobodo bufuo ha.
Read 2 Chronicles 33 in the app The whole chapter