The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 33
Nʼihi ya, Onyenwe anyị mere ka ndị ọchịagha nke eze ndị Asịrịa bịa buso ha agha, bụ ndị jidere Manase, gbanye ya nko igwe nʼimi, were ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya laa Babilọn.
2 Chronicles 33:11 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 33Next →
Wherefore the LORD brought upon them the captains of the host of the king of Assyria, which took Manasseh among the thorns, and bound him with fetters, and carried him to Babylon.
So the LORD brought against them the military commanders of the king of Assyria, who captured Manasseh, put a hook in his nose, bound him with bronze shackles, and took him to Babylon.
Therefore the LORD brought on them the captains of the army of the king of Assyria, who took Manasseh in chains, bound him with fetters, and carried him to Babylon.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
8 Ma agaghị emekwa ka ụkwụ ndị Izrel hapụ ala ahụ nke m kenyere nna nna unu, naanị ma ọ bụrụ na ha elezie anya debe ihe niile m nyere ha nʼiwu banyere iwu niile, ụkpụrụ niile na ntụziaka niile m nyere site nʼaka Mosis.”
9 Ma Manase duhiere Juda na ndị Jerusalem, mee ka ha mee ihe dị njọ karịa nke ndị mba niile ndị Onyenwe anyị lara nʼiyi site nʼihu ndị Izrel.
10 Onyenwe anyị gwara Manase na ndị ya okwu, ma ha egeghị ntị.
11 Nʼihi ya, Onyenwe anyị mere ka ndị ọchịagha nke eze ndị Asịrịa bịa buso ha agha, bụ ndị jidere Manase, gbanye ya nko igwe nʼimi, were ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya laa Babilọn.
12 Nʼoge ahụ ka anya doro Manase. O wedara onwe ya ala nke ukwuu, rịọọ amara site nʼaka Onyenwe anyị Chineke nna nna ya.
13 Onyenwe anyị nụrụ arịrịọ ya mee ya ka ọ lọtakwa nʼalaeze ya na Jerusalem. Mgbe ahụ, Manase matara na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie.
14 Ọ bụ nʼoge a ka o wughachiri mgbidi nke abụọ gburugburu obodo Devid, na mgbidi dị nʼọdịda anyanwụ iyi Gaihọn na ndagwurugwu Kidrọn. Site nʼebe ahụ, o wuru ya ruo nʼọnụ ụzọ ama Azụ, na gburugburu ugwu Ofel ebe o wuliri ya elu. O dokwara ndịisi agha ya nʼobodo niile e wusiri ike dị na Juda.
Read 2 Chronicles 33 in the app The whole chapter