The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 29
gwa ha okwu sị ha, “Geenụ m ntị unu ndị Livayị, doonụ onwe unu nsọ, dokwaanụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị Chineke nna nna unu nsọ. Wezuganụ ihe arụ niile dị nʼebe nsọ nke ụlọnsọ ahụ.
2 Chronicles 29:5 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 29Next →
And said unto them, Hear me, ye Levites, sanctify now yourselves, and sanctify the house of the LORD God of your fathers, and carry forth the filthiness out of the holy place.
“Listen to me, O Levites,” he said. “Consecrate yourselves now and consecrate the house of the LORD, the God of your fathers. Remove from the Holy Place every impurity.
and said to them, “Listen to me, you Levites! Now sanctify yourselves, and sanctify the house of the LORD, the God of your fathers, and carry the filthiness out of the holy place.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
2 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna nna ya Devid mere.
3 Nʼọnwa mbụ nke afọ ahụ e mere ya eze ka o meghere ụlọnsọ Onyenwe anyị, mezie ime ya.
4 Ọ kpọrọ ndị Livayị, na ndị nchụaja niile oku nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ukwu Chineke,
5 gwa ha okwu sị ha, “Geenụ m ntị unu ndị Livayị, doonụ onwe unu nsọ, dokwaanụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị Chineke nna nna unu nsọ. Wezuganụ ihe arụ niile dị nʼebe nsọ nke ụlọnsọ ahụ.
6 Nʼihi na nna anyị ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi; ha mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, hapụ ya. Ha wepụrụ ihu ha site nʼebe obibi Onyenwe anyị, gbakụtakwa ya azụ.
7 Ha mechikwara ụzọ ndị e si abanye na mpụta ọnụ ụlọ ahụ, menyụọkwa ọkụ dị nʼime ya. E sureekwaghị ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ọ dịkwaghị aja nsure ọkụ ọbụla a chụrụ nye Chineke nke Izrel.
8 Nʼihi nke a ka iwe Onyenwe anyị ji dakwasị Juda na Jerusalem. O meela ka ha buru ihe oke egwu, na oke ihere na oke ụjọ, dịka unu jirila anya unu hụ.
Read 2 Chronicles 29 in the app The whole chapter