The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 29
Ọ kpọrọ ndị Livayị, na ndị nchụaja niile oku nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ukwu Chineke,
2 Chronicles 29:4 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 29Next →
And he brought in the priests and the Levites, and gathered them together into the east street,
Then he brought in the priests and Levites and gathered them in the square on the east side.
He brought in the priests and the Levites and gathered them together into the wide place on the east,
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
1 Hezekaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ị bụ eze. Ọ chịrị iri afọ abụọ na itoolu na Jerusalem. Aha nne ya bụ Abija, ada Zekaraya.
2 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna nna ya Devid mere.
3 Nʼọnwa mbụ nke afọ ahụ e mere ya eze ka o meghere ụlọnsọ Onyenwe anyị, mezie ime ya.
4 Ọ kpọrọ ndị Livayị, na ndị nchụaja niile oku nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ụlọnsọ ukwu Chineke,
5 gwa ha okwu sị ha, “Geenụ m ntị unu ndị Livayị, doonụ onwe unu nsọ, dokwaanụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị Chineke nna nna unu nsọ. Wezuganụ ihe arụ niile dị nʼebe nsọ nke ụlọnsọ ahụ.
6 Nʼihi na nna anyị ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi; ha mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, hapụ ya. Ha wepụrụ ihu ha site nʼebe obibi Onyenwe anyị, gbakụtakwa ya azụ.
7 Ha mechikwara ụzọ ndị e si abanye na mpụta ọnụ ụlọ ahụ, menyụọkwa ọkụ dị nʼime ya. E sureekwaghị ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, ọ dịkwaghị aja nsure ọkụ ọbụla a chụrụ nye Chineke nke Izrel.
Read 2 Chronicles 29 in the app The whole chapter