The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 28
Ha sịrị, “Unu akpọbatakwala ndị a unu dọtara nʼagha nʼebe a, nʼihi na unu mee ya, anyị ga-abụ ndị ikpe maara nʼihu Onyenwe anyị. Unu chọrọ ịtụkwasị ihe na mmehie na ikpe ọmụma anyị? Nʼihi na ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu, iwe ya dị ọkụ na-adịkwasịkwa nʼahụ Izrel.”
2 Chronicles 28:13 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 28Next →
And said unto them, Ye shall not bring in the captives hither: for whereas we have offended against the LORD already, ye intend to add more to our sins and to our trespass: for our trespass is great, and there is fierce wrath against Israel.
“You must not bring the captives here,” they said, “for you are proposing to bring guilt upon us from the LORD and to add to our sins and our guilt. For our guilt is great, and fierce anger is upon Israel.”
and said to them, “You must not bring in the captives here, for you intend that which will bring on us a trespass against the LORD, to add to our sins and to our guilt; for our guilt is great, and there is fierce wrath against Israel.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
10 Ugbu a, unu na-achọkwa ime ndị ikom na ndị inyom Juda na Jerusalem ndị ohu unu? Ma unu abụghị ndị ikpe mmehie mara nʼebe Onyenwe anyị Chineke unu nọ?
11 Ugbu a, geenụ ntị nʼihe m na-ekwu. Kpọghachinụ ụmụnna unu ndị a unu dọtara nʼagha nʼụlọ ha, nʼihi na ugbu a Onyenwe anyị na-ewe oke iwe megide unu.”
12 Ụfọdụ ndịisi ndị Ifrem, bụ Azaraya nwa Jehohanan, na Berekaya nwa Meshilemot, na Jehizkaya nwa Shalum, na Amasa nwa Hadlai, biliri guzogide ndị ahụ si agha na-alọta.
13 Ha sịrị, “Unu akpọbatakwala ndị a unu dọtara nʼagha nʼebe a, nʼihi na unu mee ya, anyị ga-abụ ndị ikpe maara nʼihu Onyenwe anyị. Unu chọrọ ịtụkwasị ihe na mmehie na ikpe ọmụma anyị? Nʼihi na ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu, iwe ya dị ọkụ na-adịkwasịkwa nʼahụ Izrel.”
14 Ya mere, ndị agha ahụ hapụrụ ndị mkpọrọ ahụ na ihe niile ha bulatara, nʼihu ndị ozi na igwe mmadụ ahụ niile.
15 Mgbe ahụ, ndị ikom ahụ akpọrọ nʼaha nʼaha duuru ndị mkpọrọ ahụ, manye aka nʼihe ahụ niile a dọtara nʼagha wepụta uwe, na nri, na mmanya na akpụkpọụkwụ, na mmanụ, nyeghachi ha ndị ahụ niile a dọtara nʼagha. Ha bulitere ndị ọrịa nọ nʼetiti ndị ahụ a dọtara nʼagha kukwasị ha nʼelu ịnyịnya ibu. Emesịa, ha duuru mmadụ ahụ niile dughachiri ha ndị ha nọ na Jeriko, obodo nkwụ. Emesịakwa, ha laghachikwara azụ na Sameria.
16 Nʼoge ahụ, eze Ehaz zigara ndị eze Asịrịa ozi ka ọ bịa nyere ya aka.
Read 2 Chronicles 28 in the app The whole chapter