The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 2 Chronicles 28
Ugbu a, geenụ ntị nʼihe m na-ekwu. Kpọghachinụ ụmụnna unu ndị a unu dọtara nʼagha nʼụlọ ha, nʼihi na ugbu a Onyenwe anyị na-ewe oke iwe megide unu.”
2 Chronicles 28:11 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 2 Chronicles 28Next →
Now hear me therefore, and deliver the captives again, which ye have taken captive of your brethren: for the fierce wrath of the LORD is upon you.
Now therefore, listen to me and return the captives you took from your kinsmen, for the fierce anger of the LORD is upon you.”
Now hear me therefore, and send back the captives that you have taken captive from your brothers, for the fierce wrath of the LORD is on you.”
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
8 Ndị Izrel sitere nʼetiti ụmụnne ha ndị Juda dọta ndị inyom, na ụmụ okorobịa, na ụmụ agbọghọbịa ọnụọgụgụ ha dị narị puku abụọ nʼagha. Ha bukọkwaara ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha kwatara nʼagha laghachi na Sameria.
9 Ma Oded, onye amụma Onyenwe anyị, nọ na Sameria nʼoge a. Ọ pụrụ jekwuru ndị agha ahụ na Sameria sị ha, “Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha mere ka unu merie ndị Juda nʼihi na ha na-efe arụsị. Ma unu ji ọnụma gbuo ha, nke mere na ụzụ tụrụ ruo nʼeluigwe.
10 Ugbu a, unu na-achọkwa ime ndị ikom na ndị inyom Juda na Jerusalem ndị ohu unu? Ma unu abụghị ndị ikpe mmehie mara nʼebe Onyenwe anyị Chineke unu nọ?
11 Ugbu a, geenụ ntị nʼihe m na-ekwu. Kpọghachinụ ụmụnna unu ndị a unu dọtara nʼagha nʼụlọ ha, nʼihi na ugbu a Onyenwe anyị na-ewe oke iwe megide unu.”
12 Ụfọdụ ndịisi ndị Ifrem, bụ Azaraya nwa Jehohanan, na Berekaya nwa Meshilemot, na Jehizkaya nwa Shalum, na Amasa nwa Hadlai, biliri guzogide ndị ahụ si agha na-alọta.
13 Ha sịrị, “Unu akpọbatakwala ndị a unu dọtara nʼagha nʼebe a, nʼihi na unu mee ya, anyị ga-abụ ndị ikpe maara nʼihu Onyenwe anyị. Unu chọrọ ịtụkwasị ihe na mmehie na ikpe ọmụma anyị? Nʼihi na ikpe ọmụma anyị adịla ukwuu, iwe ya dị ọkụ na-adịkwasịkwa nʼahụ Izrel.”
14 Ya mere, ndị agha ahụ hapụrụ ndị mkpọrọ ahụ na ihe niile ha bulatara, nʼihu ndị ozi na igwe mmadụ ahụ niile.
Read 2 Chronicles 28 in the app The whole chapter