The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 1 Samuel 22
Ọ gwara Devid na Sọl egbuola ndị nchụaja Onyenwe anyị.
1 Samuel 22:21 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 1 Samuel 22Next →
And Abiathar shewed David that Saul had slain the LORD'S priests.
And Abiathar told David that Saul had killed the priests of the LORD.
Abiathar told David that Saul had slain the LORD’s priests.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
18 Mgbe ahụ eze nyere Doeg iwu sị ya, “Gị onwe gị, chigharịa gbuo ha.” Ya mere, Doeg onye Edọm chigharịrị tigbuo ha. Nʼụbọchị ahụ, o gburu iri ndị nchụaja asatọ na ise, ndị yi uwe akwa ọcha efọọd.
19 O ji mma agha jee Nob, obodo ndị nchụaja, gbuo ezinaụlọ ndị nchụaja niile, nwoke na nwanyị, na ụmụntakịrị, na ụmụ na-aṅụ ara. O gbukwara ehi na ịnyịnya ibu na atụrụ ha niile.
20 Otu nʼime ụmụ Ahimelek nwa Ahitub, aha ya bụ Abịata gbapụrụ, gbakwuru Devid.
21 Ọ gwara Devid na Sọl egbuola ndị nchụaja Onyenwe anyị.
22 Mgbe ahụ, Devid sịrị Abịata, “Nʼụbọchị ahụ, mgbe Doeg onye Edọm nọ nʼebe ahụ, amaara m na ọ ghaghị ịgwa Sọl. Mụ onwe m kpatara ọnwụ ndị niile nke ndị ezinaụlọ nna gị.
23 Soro m nọdụ nʼebe a, atụla ụjọ, nʼihi na onye na-achọ ndụ gị na-achọkwa ndụ nke m. Mmekpa ahụ ọbụla agaghị adakwasị gị ma mụ na gị nọdụ.”
Read 1 Samuel 22 in the app The whole chapter