The Bible › Baịbụlụ Nsọ › 1 Samuel 21
Nʼụbọchị ahụ, Devid gbapụrụ ọsọ site nʼebe Sọl nọ gbakwuru Akish eze ndị Gat.
1 Samuel 21:10 · Baịbụlụ Nsọ
← PreviousRead 1 Samuel 21Next →
And David arose, and fled that day for fear of Saul, and went to Achish the king of Gath.
That day David fled from Saul and went to Achish king of Gath.
David arose and fled that day for fear of Saul, and went to Achish the king of Gath.
Every translation above is public domain and free to share. Other versions — NIV · ESV · NKJV · NLT · NASB · CSB · AMP — are copyrighted and open on their publishers’ partner site.
7 Ma otu onye odibo Sọl nọ nʼebe ahụ nʼụbọchị ahụ, onye e jigidere nʼihu Onyenwe anyị. Ọ bụ Doeg, onye Edọm onyeisi ndị na-azụ anụ ụlọ Sọl.
8 Devid jụrụ Ahimelek ajụjụ sị ya, “I nweghị ùbe maọbụ mma agha nʼebe a? Ewetaghị m mma agha m maọbụ ngwa agha ọzọ, nʼihi na ozi eze ziri anyị dị oke ngwangwa.”
9 Onye nchụaja zaghachiri, “Mma agha Golaịat, onye Filistia, onye ahụ i tigburu na ndagwurugwu Ịla dị nʼebe a, a fụchiri ya nʼakwa nʼazụ efọọd. Ọ bụrụ na ị chọrọ ya, were ya, nʼihi na ọ dịghị mma agha ọzọ dị nʼebe a ma ọ bụghị nke ahụ.” Devid sịrị, “Ọ dịghị nke dịka ya, nye m ya.”
10 Nʼụbọchị ahụ, Devid gbapụrụ ọsọ site nʼebe Sọl nọ gbakwuru Akish eze ndị Gat.
11 Ma ndị ozi Akish sịrị ya, “Onye a ọ bụghị Devid, eze nke ala ahụ? Ọ bụghị ya bụ isi abụ ha na-abụ mgbe ha na-ete egwu na-asị: “ ‘Sọl egbuola ọtụtụ puku ndị iro ya, Devid egbukwaala iri puku kwụrụ puku ndị iro nke ya’?”
12 Mgbe Devid nụrụ okwu ndị a, ọ tụrụ egwu ihe Akish eze Gat ga-eme ya.
13 Nʼihi ya ọ gbanwere omume ya, bido ime dịka onyeisi na-adịghị mma. O bidokwara ịka akara nʼibo, bidokwa na-agụsasị ọnụ mmiri nʼahụọnụ ya.
Read 1 Samuel 21 in the app The whole chapter